The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Genesis 41
Afọ asaa nke ụba nri nke dịrị nʼala Ijipt mechara gabiga.
Genesis 41:53 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Genesis 41Next →
And the seven years of plenteousness, that was in the land of Egypt, were ended.
When the seven years of abundance in the land of Egypt came to an end,
The seven years of plenty, that were in the land of Egypt, came to an end.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
50 Tupu oge ụnwụ ahụ ebido, Asenat nwa nwanyị Pọtifera, onye nchụaja nke On, mụtara Josef ụmụ ndị ikom abụọ.
51 Josef gụrụ ọkpara ya Manase, nʼihi na ọ sịrị, “Chineke emeela ka m chefuo ahụhụ m niile, mekwa ka m chefuo ndị ezinaụlọ nna m.”
52 Josef gụrụ nwa ya nke abụọ Ifrem. Ọ sịrị, “Nʼihi na Chineke emeela ka m mịa mkpụrụ nʼala nke ahụhụ m.”
53 Afọ asaa nke ụba nri nke dịrị nʼala Ijipt mechara gabiga.
54 Afọ asaa nke ụnwụ bidoro bịawa dịka Josef kwuru. Ụnwụ nọ nʼobodo niile, ma nʼala Ijipt niile nri dị.
55 Ka agụ jidere ala Ijipt niile, ndị mmadụ tikuru Fero ka o nye ha nri. Ma Fero gwara ndị Ijipt niile, “Jekwurunụ Josef. Ihe ọbụla ọ gwara unu meenụ ya.”
56 Mgbe ụnwụ ahụ gbasara ruo nʼakụkụ niile nke ala ahụ, Josef meghepụrụ ụlọ ichebe nri niile bido iresi ndị Ijipt nri, nʼihi na ụnwụ ahụ dị njọ nʼala Ijipt niile.
Read Genesis 41 in the app The whole chapter