The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Genesis 41
Fero jụrụ ndịisi ọchịchị ya, “Anyị ga-achọtali onye ọzọ dịka nwoke a, onye mmụọ nke Chineke dị nʼime ya?”
Genesis 41:38 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Genesis 41Next →
And Pharaoh said unto his servants, Can we find such a one as this is, a man in whom the Spirit of God is?
So Pharaoh asked them, “Can we find anyone like this man, in whom the Spirit of God abides?”
Pharaoh said to his servants, “Can we find such a one as this, a man in whom is the Spirit of God?”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
35 Ka ha kpokọtaa nri niile ga-adị nʼoge ịba ụba nke ihe oriri, nke ga-adị nʼafọ ndị a na-abịa. Ka ha kpokọta ha nʼụlọ ichebe nri nke ga-adị nʼokpuru ọchịchị Fero. Ka ọ bụrụ nri e debere nʼobodo dị iche iche.
36 A ga-echebe nri ndị a nke ọma maka ndị bi nʼala a, ka ọ bụrụ nri a ga-eri nʼime afọ asaa ndị ahụ nke ụnwụ ga-adị nʼala Ijipt, ka ụnwụ ghara ibibi ala a.”
37 Ntụpụta ahụ dị mma nʼanya Fero na ndịisi ọchịchị ya.
38 Fero jụrụ ndịisi ọchịchị ya, “Anyị ga-achọtali onye ọzọ dịka nwoke a, onye mmụọ nke Chineke dị nʼime ya?”
39 Ya mere Fero tụgharịrị sị Josef, “Ebe Chineke kpugheere gị ihe ndị a, o nweghị onye ọzọ nwere ezi nghọta na amamihe dịka gị.
40 Gị onwe gị ga-abụ onye na-elekọta ụlọeze m. Ndị m niile ga-erube isi nʼiwu ọbụla i nyere. Ọ bụ naanị nʼocheeze ka m ga-eji dị ukwuu karịa gị.”
41 Fero gwara Josef, “Lee, emeela m gị onye nlekọta ala Ijipt niile.”
Read Genesis 41 in the app The whole chapter