The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Genesis 41

Genesis 41:22

“Mgbe m rọrọ nrọ ọzọ, a hụrụ m ogbe ọka asaa nke mịrị nʼotu ukwu ọka. Ọka asaa ndị a buru ibu, dị mma ile anya.

Genesis 41:22 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Genesis 41Next →

Genesis 41:22 in other translations

KJV King James Version

And I saw in my dream, and, behold, seven ears came up in one stalk, full and good:

BSB Berean Standard Bible

In my dream I also saw seven heads of grain, plump and ripe, growing on a single stalk.

WEB World English Bible

I saw in my dream, and behold, seven heads of grain came up on one stalk, full and good;

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

19 Emesịa, a hụrụ m ehi asaa ọzọ ka ha sikwa nʼosimiri ahụ pụta. Ehi ndị a ejighị ahụ. Ha bụ ọkpụkpụ ọkpụkpụ, jọọ njọ ile anya. Nʼezie, ahụtụbeghị m ụdị ehi dị otu a nʼala Ijipt niile.

20 Ehi asaa ndị a jọrọ njọ riri ehi ndị ahụ buru ibu, bụ ndị bu ha ụzọ si nʼosimiri ahụ pụta.

21 Ma mgbe ha risiri ehi ndị a, nri ahụ emeghị ka ụdịdị ha gbanwee. Ha dịkwa otu ha dị. Mgbe m hụsịrị ihe a, etetara m nʼụra.

22 “Mgbe m rọrọ nrọ ọzọ, a hụrụ m ogbe ọka asaa nke mịrị nʼotu ukwu ọka. Ọka asaa ndị a buru ibu, dị mma ile anya.

23 Ogbe ọka asaa ọzọ mịkwara nʼelu ukwu ọka ahụ, ma ndị a kpọnwụrụ akpọnwụ, fịkpọkwa afịkpọ nʼihi nʼikuku si nʼọwụwa anyanwụ chakpọrọ ha.

24 Ma ọka ndị a fịkpọrọ afịkpọ lodara ọka asaa ndị ahụ mara mma. Akọọlara m ndị majiki ihe ndị a, ma ọ dịghị onye nʼime ha nwere ike ịkọwara m ihe nrọ ndị a pụtara.”

25 Mgbe ahụ, Josef sịrị Fero, “Nrọ abụọ Fero rọrọ pụtara otu ihe. Chineke esitela na nrọ ndị a gwa Fero ihe ọ na-aga ime.

Read Genesis 41 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV