The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Genesis 4
Enọk bụ nna Irad, Irad bụ nna Mehujael, Mehujael bụ nna Metusael, Metusael abụrụ nna Lamek.
Genesis 4:18 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Genesis 4Next →
And unto Enoch was born Irad: and Irad begat Mehujael: and Mehujael begat Methusael: and Methusael begat Lamech.
Now to Enoch was born Irad, and Irad was the father of Mehujael, and Mehujael was the father of Methusael, and Methusael was the father of Lamech.
Irad was born to Enoch. Irad became the father of Mehujael. Mehujael became the father of Methushael. Methushael became the father of Lamech.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
15 Onyenwe anyị zara sị ya, “O nweghị onye ga-egbu gị, nʼihi na aga m atụkwasịrị onye ọbụla metụrụ gị aka ntaramahụhụ okpukpu asaa karịa nke m nyere gị.” Ya mere, Onyenwe anyị kara Ken akara iji gbochie onye ọbụla hụrụ ya igbu ya.
16 Ken sitere nʼihu Onyenwe anyị pụọ gaa biri nʼala Nọd, obodo dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Iden.
17 Ken na nwunye ya dinakọrọ, nwunye ya tụụrụ ime mụta nwa nwoke aha ya bụ Enọk. Nʼoge a, Ken nọ na-ewu otu obodo ọ gụrụ Enọk, nke bụ aha nwa ya nwoke.
18 Enọk bụ nna Irad, Irad bụ nna Mehujael, Mehujael bụ nna Metusael, Metusael abụrụ nna Lamek.
19 Lamek lụrụ ụmụ nwanyị abụọ. Aha nwunye ya nke mbụ bụ Ada. Aha nke ọzọ bụ Zila.
20 Ada mụtara Jabal, onye bụ nna ndị na-azụ anụ ụlọ, na ndị na-ebi nʼụlọ ikwu.
21 Aha nwanne ya nwoke bụ Jubal, onye mbụ bụ nna ndị na-akpọ ụbọ akwara, na ndị na-afụ opi.
Read Genesis 4 in the app The whole chapter