The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Genesis 36
Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Ịsọ, nna obodo Edọm, nʼala ugwu ugwu Sia.
Genesis 36:9 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Genesis 36Next →
And these are the generations of Esau the father of the Edomites in mount Seir:
This is the account of Esau, the father of the Edomites, in the area of Mount Seir.
This is the history of the generations of Esau the father of the Edomites in the hill country of Seir:
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
6 Emesịa, Ịsọ duuru ndị nwunye ya na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom, na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya. Ọ chịkọọrọ anụ ụlọ ya niile, na akụ niile ọ kpatara nʼala Kenan kwapụ gaa biri nʼala dị anya site nʼebe nwanne ya Jekọb nọ.
7 Ebe ọ bụ na akụnụba ha nwere dịkarịrị ukwuu ha ibikọta ọnụ, tinyekwara na ala ebe ha bi enwezighị ike ibuli ha nʼihi anụ ụlọ niile ha nwere.
8 Ya mere, Ịsọ gara biri nʼala ugwu ugwu Sia, Ịsọ bụkwa Edọm.
9 Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Ịsọ, nna obodo Edọm, nʼala ugwu ugwu Sia.
10 Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Ịsọ mụtara. Elifaz bụ ọkpara Ada, nwunye Ịsọ. Nwanne ya bụ Reuel, nwa Basemat, nwunye Ịsọ.
11 Ụmụ Elifaz ndị ikom bụ, Teman, Ọmaa, Zefo, Gatam na Kenaz.
12 Elifaz nwa Ịsọ nwere iko nwanyị aha ya bụ Timna, onye mụtaara ya Amalek. Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Ada, nwunye Ịsọ.
Read Genesis 36 in the app The whole chapter