The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Genesis 35

Genesis 35:5

Ha biliri ije. Egwu Chineke dakwasịrị obodo niile gbara ha gburugburu. Ọ dịghị ndị chụsoro ha.

Genesis 35:5 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Genesis 35Next →

Genesis 35:5 in other translations

KJV King James Version

And they journeyed: and the terror of God was upon the cities that were round about them, and they did not pursue after the sons of Jacob.

BSB Berean Standard Bible

As they set out, a terror from God fell over the surrounding cities, so that they did not pursue Jacob’s sons.

WEB World English Bible

They traveled, and a terror of God was on the cities that were around them, and they didn’t pursue the sons of Jacob.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

2 Ya mere, Jekọb gwara ndị ezinaụlọ ya na ndị niile so ya sị, “Wezuganụ chi ndị ala ọzọ dị nʼetiti unu. Doonụ onwe unu ọcha, gbanweekwanụ uwe unu.

3 Bilienụ, ka anyị gaa Betel, ebe m ga-ewu ebe ịchụ aja nye Chineke, onye zara m oku nʼụbọchị nsogbu m, ma nọnyekwara m na njem nke m gara.”

4 Ya mere, ha nyere Jekọb chi ndị ala ọzọ niile ha ji nʼaka, na ọla niile dị ha na ntị. Jekọb chịịrị ha niile lie ha nʼokpuru osisi ook dị na Shekem.

5 Ha biliri ije. Egwu Chineke dakwasịrị obodo niile gbara ha gburugburu. Ọ dịghị ndị chụsoro ha.

6 Jekọb na ndị niile so ya rutere Luz, nke a na-akpọkwa Betel nke dị na Kenan.

7 Jekọb wuru ebe ịchụ aja nʼebe a, kpọọ aha ebe ahụ El Betel, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Chineke gosiri ya onwe ya mgbe ọ na-agbanarị Ịsọ nwanne ya nwoke.

8 Mgbe nke a gasịrị, Debọra, nwanyị lekọtara Ribeka mgbe ọ bụ nwantakịrị, nwụrụ. E liri ya nʼokpuru osisi ook dị na Betel. A kpọkwara ebe ahụ, “Osisi ook ebe ịkwa akwa.”

Read Genesis 35 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV