The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Genesis 32
Iri nne ịnyịnya kamel atọ (30) na ụmụ ha, na iri nne ehi anọ (40), oke ehi iri (10), iri nne ịnyịnya ibu abụọ (20), oke ịnyịnya ibu iri (10).
Genesis 32:15 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Genesis 32Next →
Thirty milch camels with their colts, forty kine, and ten bulls, twenty she asses, and ten foals.
30 milk camels with their young, 40 cows, 10 bulls, 20 female donkeys, and 10 male donkeys.
thirty milk camels and their colts, forty cows, ten bulls, twenty female donkeys and ten foals.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
12 Ọ bụ gị kwuru sị, ‘Aga m eme ka ihe gaara gị nke ọma, meekwa ka ụmụ ụmụ gị dịrị ka aja nke dị nʼọnụ osimiri, nke mmadụ na-apụghị ịgụta ọnụ.’ ”
13 Jekọb rahụrụ nʼebe ahụ nʼabalị ahụ. Site nʼihe niile o nwere, ọ họpụtara onyinye ọ ga-enye nwanne ya Ịsọ.
14 Ọ kwadoro inye ya: narị nne ewu abụọ (200), iri mkpi abụọ (20), narị nne atụrụ abụọ (200), iri ebule abụọ (20)
15 Iri nne ịnyịnya kamel atọ (30) na ụmụ ha, na iri nne ehi anọ (40), oke ehi iri (10), iri nne ịnyịnya ibu abụọ (20), oke ịnyịnya ibu iri (10).
16 O weere onyinye ndị a niile nyefee nʼaka ndị ozi ya nʼusoro dịka ụdị ha si dị. Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi sị ha, “Burunu ụzọ na-aga, meenụ ka ohere dị nʼetiti igwe anụ na igwe ibe ya.”
17 O nyere onye mbụ iwu sị ha, “Mgbe Ịsọ nwanne m zutere unu jụọ unu ajụjụ sị, ‘Onye bụ nna unu ukwu? Ebee ka unu na-aga? Onye nwe anụ ụlọ ndị a niile unu chị na-aga?’
18 Unu ga-aza sị ya, ‘Anụ ụlọ ndị a bụ nke ohu gị Jekọb. Ha bụ onyinye e zitere onyenwe m Ịsọ, lee ka ọ na-abịa nʼazụ anyị.’ ”
Read Genesis 32 in the app The whole chapter