The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Genesis 31
Ma ọ bụrụ na ị chọta onye ọbụla ji chi gị ndị a, onye ahụ ga-anwụ. Nʼihu ndị ikwu gị ndị a, chọgharịa nʼonwe gị, lee ma ị ga-achọta ihe ọbụla bụ nke gị dị m nʼaka. Ọ bụrụ na ị chọta ya, were ya.” Ma Jekọb amaghị na Rechel zuuru chi ndị ahụ.
Genesis 31:32 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Genesis 31Next →
With whomsoever thou findest thy gods, let him not live: before our brethren discern thou what is thine with me, and take it to thee. For Jacob knew not that Rachel had stolen them.
If you find your gods with anyone here, he shall not live! In the presence of our relatives, see for yourself if anything is yours, and take it back.” For Jacob did not know that Rachel had stolen the idols.
Anyone you find your gods with shall not live. Before our relatives, discern what is yours with me, and take it.” For Jacob didn’t know that Rachel had stolen them.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
29 Enwere m ike merụọ gị ahụ ugbu a, ma Chineke nke nna gị mere ka m hụ ya anya na nrọ nʼabalị gara aga. Ọ dọrọ m aka na ntị sị m, ‘Kpachapụ anya gị hụ na o nweghị ihe ị gwara Jekọb, maọbụ okwu dị mma, maọbụ nke dị njọ.’
30 Ugbu a, ị na-ala nʼihi na ọ gụrụ gị agụụ ịlaghachi nʼụlọ nna gị, ma gịnị mere i ji zuru chi m?”
31 Jekọb zara sị Leban, “Nʼihi na m tụrụ egwu, nʼihi na m chere sị na ị ga-eji ike napụ m ụmụ gị ndị inyom a.
32 Ma ọ bụrụ na ị chọta onye ọbụla ji chi gị ndị a, onye ahụ ga-anwụ. Nʼihu ndị ikwu gị ndị a, chọgharịa nʼonwe gị, lee ma ị ga-achọta ihe ọbụla bụ nke gị dị m nʼaka. Ọ bụrụ na ị chọta ya, were ya.” Ma Jekọb amaghị na Rechel zuuru chi ndị ahụ.
33 Ya mere, Leban bara nʼụlọ ikwu Jekọb, na nʼime ụlọ ikwu Lịa, na nʼime ụlọ ikwu ndị odibo nwanyị abụọ ya, ma o nweghị ihe ọ chọtara. O sitere nʼụlọ ikwu Lịa pụta baa nʼụlọ ikwu Rechel.
34 Nʼoge a, Rechel ewerela arụsị ezinaụlọ ndị ahụ tinye ha nʼime akwa e ji anọkwasị nʼelu ịnyịnya kamel nọdụ ọdụ nʼelu ya. Leban chọgharịrị ebe niile nʼime ụlọ ikwu ahụ ma ọ chọtaghị arụsị ezinaụlọ ndị ahụ.
35 Mgbe ahụ, Rechel gwara nna ya Leban sị, “Biko, ewela iwe nna m ukwu, nʼihi na enweghị m ike ibili ọtọ nʼihu gị. Anọ m nʼọnọdụ ndị inyom na-anọ kwa ọnwa.” Leban chọgharịrị ebe niile, ma ọ hụghị arụsị ezinaụlọ ndị ahụ.
Read Genesis 31 in the app The whole chapter