The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Genesis 31
Gịnị mere i nyeghị m ohere ka m sutu ụmụ ụmụ m na ụmụ m ndị inyom ọnụ sị ha laa nke ọma? Omume a i mere bụ omume nzuzu.
Genesis 31:28 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Genesis 31Next →
And hast not suffered me to kiss my sons and my daughters? thou hast now done foolishly in so doing.
But you did not even let me kiss my grandchildren and my daughters goodbye. Now you have done a foolish thing.
and didn’t allow me to kiss my sons and my daughters? Now have you done foolishly.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
25 Jekọb amaala ụlọ ikwu ya nʼala ugwu Gilead mgbe Leban chụkwutere ya. Leban na ndị ikwu ya makwara ụlọ ikwu nke ha nʼebe ahụ.
26 Leban sịrị Jekọb, “Gịnị bụ ihe a i mere? Ị ghọgbuola m. I burula ụmụ m ndị inyom dịka ndị a dọtara nʼagha?
27 Gịnị mere i ji ghọgbuo m, zoro ezo gbapụ? Gịnị mere ị gwaghị m ka m jiri ọṅụ na ịbụ abụ nke ya na ịkpọ ụbọ akwara na iti ịgba so, zilaga gị?
28 Gịnị mere i nyeghị m ohere ka m sutu ụmụ ụmụ m na ụmụ m ndị inyom ọnụ sị ha laa nke ọma? Omume a i mere bụ omume nzuzu.
29 Enwere m ike merụọ gị ahụ ugbu a, ma Chineke nke nna gị mere ka m hụ ya anya na nrọ nʼabalị gara aga. Ọ dọrọ m aka na ntị sị m, ‘Kpachapụ anya gị hụ na o nweghị ihe ị gwara Jekọb, maọbụ okwu dị mma, maọbụ nke dị njọ.’
30 Ugbu a, ị na-ala nʼihi na ọ gụrụ gị agụụ ịlaghachi nʼụlọ nna gị, ma gịnị mere i ji zuru chi m?”
31 Jekọb zara sị Leban, “Nʼihi na m tụrụ egwu, nʼihi na m chere sị na ị ga-eji ike napụ m ụmụ gị ndị inyom a.
Read Genesis 31 in the app The whole chapter