The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Genesis 3

Genesis 3:20

Adam gụrụ nwunye ya Iiv, nʼihi na ọ bụ nne mmadụ niile dị ndụ.

Genesis 3:20 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Genesis 3Next →

Genesis 3:20 in other translations

KJV King James Version

And Adam called his wife's name Eve; because she was the mother of all living.

BSB Berean Standard Bible

And Adam named his wife Eve, because she would be the mother of all the living.

WEB World English Bible

The man called his wife Eve because she would be the mother of all the living.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

17 Ọ gwara Adam sị, “Nʼihi na ị ṅara nwunye gị ntị, rie mkpụrụ site nʼosisi ahụ m nyere gị iwu sị, ‘Gị erila mkpụrụ sitere na ya,’ “Ala bụ ihe a bụrụ ọnụ nʼihi gị, site nʼoke ndọgbu nʼọrụ ka ị ga-eri ihe si na ya pụta ogologo ụbọchị ndụ gị niile.

18 Ọ ga-erupụtara gị ogwu na uke, ị ga-erikwa ahịhịa nke ubi.

19 Site nʼọsụsọ nke ga-agbapụta gị nʼihu ka ị ga-eri nri gị tutu ruo mgbe ị lọghachiri nʼala ebe ọ bụ site nʼala ka e si mepụta gị nʼihi na aja ka ị bụ, nʼaja ka ị ga-alaghachikwa.”

20 Adam gụrụ nwunye ya Iiv, nʼihi na ọ bụ nne mmadụ niile dị ndụ.

21 Emesịa, Onyenwe anyị Chineke weere akpụkpọ anụ meere Adam na nwunye ya uwe oyiyi.

22 Onyenwe anyị Chineke sịrị, “Lee, mmadụ adịla ka onye ọbụla nʼime anyị site nʼịmata ihe ọma na ihe ọjọọ. Ugbu a, ka ọ gharakwa ị setịpụ aka ya ghọrọ mkpụrụ osisi ahụ na-enye ndụ rie, si otu a dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”

23 Nʼihi nke a, Onyenwe anyị Chineke chụpụrụ ya site nʼogige Iden ka ọ gaa na-arụ ọrụ nʼala e si wepụta ya.

Read Genesis 3 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV