The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Genesis 29
Jekọb kọwaara Rechel na ọ bụ onye ikwu nna ya, bụrụkwa nwa Ribeka. Nʼihi ya Rechel ji ọsọ gbalaa nʼụlọ ha kọọrọ nna ya.
Genesis 29:12 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Genesis 29Next →
And Jacob told Rachel that he was her father's brother, and that he was Rebekah's son: and she ran and told her father.
He told Rachel that he was Rebekah’s son, a relative of her father, and she ran and told her father.
Jacob told Rachel that he was her father’s relative, and that he was Rebekah’s son. She ran and told her father.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
9 Mgbe Jekọb na ndị ọzụzụ atụrụ ndị a kpụ okwu nʼọnụ, Rechel chịịrị atụrụ nna ya bịakwute ha, nʼihi na onye ọzụzụ atụrụ nwanyị ka ọ bụ.
10 Mgbe Jekọb hụrụ Rechel nwa Leban nwanne nne ya, hụkwa igwe atụrụ Leban, ọ meghepụrụ nkume ahụ e ji mechie ọnụ olulu mmiri ahụ nye igwe atụrụ Leban, nwanne nne ya mmiri ka ha ṅụọ.
11 Emesịa, Jekọb suturu Rechel ọnụ, kwaa akwa nʼoke olu.
12 Jekọb kọwaara Rechel na ọ bụ onye ikwu nna ya, bụrụkwa nwa Ribeka. Nʼihi ya Rechel ji ọsọ gbalaa nʼụlọ ha kọọrọ nna ya.
13 Mgbe Leban nụrụ maka Jekọb nwa nwanne ya nwanyị, o mere ngwangwa pụọ izute ya. Ọ makụrụ ya, sutu ya ọnụ, kpọrọ ya laa nʼụlọ. Nʼebe ahụ, Jekọb kọọrọ ya ihe ndị a niile.
14 Leban sịrị ya, “Nʼezie, ị bụ ọkpụkpụ m na anụ ahụ m.” Ọ nọnyeere ya otu ọnwa.
15 Leban sịrị Jekọb, “Ọ bụ nʼihi na ị bụ onye ikwu m ka ị na-agbara m odibo nʼefu? Gwa m ego ole m ga-akwụ gị nʼihi ọrụ ị na-arụrụ m?”
Read Genesis 29 in the app The whole chapter