The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Genesis 27
Ka ọtụtụ mba jeere gị ozi, ka ndị mmadụ kpọọ isiala nye gị. Bụrụ onye ọchịchị nʼebe ụmụnna gị nọ, ka ụmụ nne gị mụrụ kpọọ isiala nye gị. Ka ndị niile na-abụ gị ọnụ bụrụ ndị a bụrụ ọnụ, ka ndị na-agọzi gị bụrụ ndị a gọziri agọzi.”
Genesis 27:29 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Genesis 27Next →
Let people serve thee, and nations bow down to thee: be lord over thy brethren, and let thy mother's sons bow down to thee: cursed be every one that curseth thee, and blessed be he that blesseth thee.
May peoples serve you and nations bow down to you. May you be the master of your brothers, and may the sons of your mother bow down to you. May those who curse you be cursed, and those who bless you be blessed.”
Let peoples serve you, and nations bow down to you. Be lord over your brothers. Let your mother’s sons bow down to you. Cursed be everyone who curses you. Blessed be everyone who blesses you.”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
26 Mgbe ahụ, nna ya Aịzik sịrị ya, “Bịa nʼebe a nwa m nwoke, sutu m ọnụ.”
27 Ya mere, o jekwuuru ya sutu ya ọnụ. Mgbe Aịzik nụrụ isisi uwe ya, ọ gọziri ya, sị, “Nʼezie, isisi nwa m nwoke dịka isisi ala ubi nke Onyenwe anyị gọziri.
28 Ka Chineke nye gị site nʼigirigi nke eluigwe, na mmanụ nke ala, ụba nke mkpụrụ ubi na mmanya ọhụrụ
29 Ka ọtụtụ mba jeere gị ozi, ka ndị mmadụ kpọọ isiala nye gị. Bụrụ onye ọchịchị nʼebe ụmụnna gị nọ, ka ụmụ nne gị mụrụ kpọọ isiala nye gị. Ka ndị niile na-abụ gị ọnụ bụrụ ndị a bụrụ ọnụ, ka ndị na-agọzi gị bụrụ ndị a gọziri agọzi.”
30 Mgbe Aịzik gọzichara Jekọb, ka Jekọb si nʼihu ya na-apụ, lee Ịsọ ka o si ịchụ nta na-alọbata.
31 Ya onwe ya sikwara nri na-atọ ụtọ butere nna ya. Mgbe ahụ, ọ gwara ya sị, “Ka nna m, bilie, rie anụ nwa ya si nʼọhịa gbute, ka gị onwe gị nye m ngọzị gị.”
32 Aịzik zara sị ya, “Ị bụ onye?” Ọ zara sị, “Abụ m nwa gị nwoke Ịsọ, ọkpara gị Ịsọ.”
Read Genesis 27 in the app The whole chapter