The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Genesis 26

Genesis 26:8

Mgbe Aịzik nọrọ ebe ahụ ogologo oge, Abimelek eze ndị Filistia, sitere na oghereikuku ya lepụ anya hụ Aịzik ka ọ nọ na-egwusa Ribeka nwunye ya egwu.

Genesis 26:8 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Genesis 26Next →

Genesis 26:8 in other translations

KJV King James Version

And it came to pass, when he had been there a long time, that Abimelech king of the Philistines looked out at a window, and saw, and, behold, Isaac was sporting with Rebekah his wife.

BSB Berean Standard Bible

When Isaac had been there a long time, Abimelech king of the Philistines looked down from the window and was surprised to see Isaac caressing his wife Rebekah.

WEB World English Bible

When he had been there a long time, Abimelech king of the Philistines looked out at a window, and saw, and, behold, Isaac was caressing Rebekah, his wife.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

5 Ihe ndị a niile ka m ga-eme nʼihi na Ebraham rubere isi ime ihe m gwara ya, na idebe iwu m na ụkpụrụ m, na ịdọ aka na ntị m.”

6 Ya mere, Aịzik nọgidere nʼobodo Gera.

7 Mgbe ndị obodo ahụ jụrụ ya banyere nwunye ya, ọ gwara ha sị, “Ọ bụ nwanne m nwanyị.” Ọ tụrụ ụjọ ị sị ha, “Nwunye m ka ọ bụ,” O chere nʼobi ya sị, “Ndị ikom obodo a nwere ike gbuo m nʼihi Ribeka. Nʼihi na Ribeka nʼonwe ya mara mma ile anya.”

8 Mgbe Aịzik nọrọ ebe ahụ ogologo oge, Abimelek eze ndị Filistia, sitere na oghereikuku ya lepụ anya hụ Aịzik ka ọ nọ na-egwusa Ribeka nwunye ya egwu.

9 Ya mere, Abimelek kpọrọ Aịzik sị, “Nwunye gị ka ọ bụ nʼezie. Gịnị mere i ji gwa anyị na ọ bụ nwanne gị nwanyị?” Aịzik zara ya, “Ọ bụ nʼihi na m chere na-enwere ike igbu m nʼihi ya.”

10 Abimelek sịrị, “Gịnị bụ ihe a i mere anyị? Otu nwoke nʼetiti anyị gaara akpọrọ nwunye gị dinaa ya. Ị gaara esi otu a wetara anyị ikpe ọmụma.”

11 Ya mere, Abimelek nyere ndị niile ya iwu, sị ha, “Onye ọbụla metụrụ nwoke a maọbụ nwunye ya aka, aghaghị ime ka ọ nwụọ.”

Read Genesis 26 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV