The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Genesis 26
Aga m eme ka ụmụ ụmụ gị mụbaa, mee ka ha hie nne nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando dị na mbara eluigwe. Ha ka m ga-enye ala ndị a niile. Aga m esite na mkpụrụ gị gọzie mba niile nke ụwa.
Genesis 26:4 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Genesis 26Next →
And I will make thy seed to multiply as the stars of heaven, and will give unto thy seed all these countries; and in thy seed shall all the nations of the earth be blessed;
I will make your descendants as numerous as the stars in the sky, and I will give them all these lands, and through your offspring all nations of the earth will be blessed,
I will multiply your offspring as the stars of the sky, and will give all these lands to your offspring. In your offspring all the nations of the earth will be blessed,
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Nʼoge a, ụnwụ dara nʼala ahụ. Ụnwụ a dị iche nʼụnwụ mbụ nke dara nʼoge Ebraham dị ndụ. Aịzik jekwuru Abimelek eze ndị Filistia nʼobodo Gera.
2 Onyenwe anyị gosiri Aịzik onwe ya, sị, “Agakwala Ijipt; biri nʼala ahụ m sị gị biri nʼime ya.
3 Nọrọ nʼala a nwa oge nta, aga m anọnyere gị ma gọziekwa gị, nʼihi na gị na ụmụ ụmụ gị ka m ga-enye ala ndị a niile. Aga m emezukwa iyi ahụ m ṅụrụ nye Ebraham nna gị.
4 Aga m eme ka ụmụ ụmụ gị mụbaa, mee ka ha hie nne nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando dị na mbara eluigwe. Ha ka m ga-enye ala ndị a niile. Aga m esite na mkpụrụ gị gọzie mba niile nke ụwa.
5 Ihe ndị a niile ka m ga-eme nʼihi na Ebraham rubere isi ime ihe m gwara ya, na idebe iwu m na ụkpụrụ m, na ịdọ aka na ntị m.”
6 Ya mere, Aịzik nọgidere nʼobodo Gera.
7 Mgbe ndị obodo ahụ jụrụ ya banyere nwunye ya, ọ gwara ha sị, “Ọ bụ nwanne m nwanyị.” Ọ tụrụ ụjọ ị sị ha, “Nwunye m ka ọ bụ,” O chere nʼobi ya sị, “Ndị ikom obodo a nwere ike gbuo m nʼihi Ribeka. Nʼihi na Ribeka nʼonwe ya mara mma ile anya.”
Read Genesis 26 in the app The whole chapter