The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Genesis 24
Mgbe ihe ndị a na-eme, ohu ahụ gbara nkịtị na-ele ya anya ịchọpụta ma Onyenwe anyị emeela ka ije ya bụrụ ihe gara nke ọma.
Genesis 24:21 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Genesis 24Next →
And the man wondering at her held his peace, to wit whether the LORD had made his journey prosperous or not.
Meanwhile, the man watched her silently to see whether or not the LORD had made his journey a success.
The man looked steadfastly at her, remaining silent, to know whether the LORD had made his journey prosperous or not.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
18 Ọ mere ngwangwa budata ite ahụ nʼaka ya, hulata ya si ya, “Ṅụọ, onyenwe m.”
19 Mgbe o nyechara ya mmiri, ọ sịrị, “Aga m ekutekwa mmiri nye ịnyịnya kamel gị ndị a ruo mgbe ha ṅụjuru afọ.”
20 Ngwangwa, ọ wụpụrụ mmiri dị nʼite ya nʼime ihe anụ ụlọ ji aṅụ mmiri, gbara ọsọ gaa kute mmiri ọzọ na-agbanye nʼime ihe ahụ. O kugidere mmiri tutu ruo mgbe ịnyịnya kamel ndị ahụ ṅụjuchara afọ.
21 Mgbe ihe ndị a na-eme, ohu ahụ gbara nkịtị na-ele ya anya ịchọpụta ma Onyenwe anyị emeela ka ije ya bụrụ ihe gara nke ọma.
22 Mgbe ịnyịnya kamel ndị ahụ ṅụsịrị mmiri, nwoke ahụ wepụtara mgbanimi ọlaedo nke ọtụtụ ya bụ otu beka, na mgbaaka ọlaedo abụọ nke ọtụtụ ha bụ shekel iri.
23 Ọ jụrụ ya sị, “Nwa onye ka ị bụ? Ohere ọ dị nʼụlọ nna gị ebe mụ na ịnyịnya kamel ndị a ga-anọ nʼabalị a?”
24 Ọ zara sị ya, “Abụ m nwa Betuel, nwa Milka nwunye Nahọ.”
Read Genesis 24 in the app The whole chapter