The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Genesis 24
Ọ gwara onyeisi ndị ozi nʼụlọ ya, onye nke na-elekọta ihe niile o nwere sị ya, “Tinye aka gị nʼokpuru apata m.
Genesis 24:2 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Genesis 24Next →
And Abraham said unto his eldest servant of his house, that ruled over all that he had, Put, I pray thee, thy hand under my thigh:
So Abraham instructed the chief servant of his household, who managed all he owned, “Place your hand under my thigh,
Abraham said to his servant, the elder of his house, who ruled over all that he had, “Please put your hand under my thigh.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Ugbu a, Ebraham aghọọla agadi nʼahụ ya ma nʼọnụọgụgụ afọ ya. Onyenwe anyị agọziela ya nʼụzọ niile
2 Ọ gwara onyeisi ndị ozi nʼụlọ ya, onye nke na-elekọta ihe niile o nwere sị ya, “Tinye aka gị nʼokpuru apata m.
3 Achọrọ m ka i jiri aha Onyenwe anyị Chineke nke eluigwe na ụwa, ṅụọra m iyi, na ị gaghị achọtara nwa m nwoke nwunye site nʼetiti ndị Kenan, ndị m bi nʼetiti ha.
4 Kama na ị ga-aga nʼala nke m na ụmụnna m lụtara nwa m, bụ Aịzik, nwunye nʼetiti ụmụnna m.”
5 Ohu ahụ jụrụ ya, “Ọ bụrụkwanụ na nwaagbọghọ ahụ achọghị isoro m lọghachi nʼebe a, m ga-akpọrọ nwa gị nwoke laghachi nʼobodo i si bịa?”
Read Genesis 24 in the app The whole chapter