The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Genesis 12
Ọzọ, Ebram si nʼebe ahụ pụọ gaa ije rute Negev.
Genesis 12:9 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Genesis 12Next →
And Abram journeyed, going on still toward the south.
And Abram journeyed on toward the Negev.
Abram traveled, still going on toward the South.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
6 Ebram jere ije nʼime ala Kenan jeruo nʼebe osisi ukwu More, nke dị nʼobodo Shekem. Ndị Kenan bi nʼala ahụ nʼoge ahụ.
7 Onyenwe anyị mere ka Ebram hụ ya anya, ọ sịrị, “Aga m enye mkpụrụ gị ala a.” Ya mere, Ebram wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ nye Onyenwe anyị onye gosiri ya onwe ya.
8 Emesịa, Ebram hapụrụ ebe ahụ chee ihu nʼala ugwu dị nʼọwụwa anyanwụ Betel, maa ụlọ ikwu ya. Obodo Betel dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ma obodo Ai dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ebe ọ mara ụlọ ikwu ya. Nʼebe nsọ ahụ Ebram wuru ebe ịchụ aja, nọrọ nʼebe ahụ kpọkuo aha Onyenwe anyị.
9 Ọzọ, Ebram si nʼebe ahụ pụọ gaa ije rute Negev.
10 Nʼoge ahụ, oke ụnwụ dara nʼala ahụ. Nʼihi ya, Ebram hapụrụ ala ahụ gaa nʼala Ijipt, ebe o biri nwa oge.
11 Ma mgbe ha na-akwado ịbanye ala Ijipt, ọ gwara Serai nwunye ya sị, “Amaara m na ị bụ nwanyị mara mma.
12 Mgbe ndị Ijipt ga-ahụ gị, ha ga-asị, ‘Onye a bụ nwunye ya.’ Mgbe ahụ, ha ga-egbu m ma hapụ gị ndụ.
Read Genesis 12 in the app The whole chapter