The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Ezra 4
Ugbu a, nye iwu ka ndị ikom ndị ahụ kwụsị ọrụ, ka a ghara iwuzi obodo a tutu ruo mgbe m ga-enye iwu.
Ezra 4:21 · Baịbụlụ Nsọ
Give ye now commandment to cause these men to cease, and that this city be not builded, until another commandment shall be given from me.
Now, therefore, issue an order for these men to stop, so that this city will not be rebuilt until I so order.
Make a decree now to cause these men to cease, and that this city not be built until a decree is made by me.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
18 Akwụkwọ ozi ahụ unu zitere anyị, agụọla ma tapịakwaa ya nʼihu m.
19 Enyere m iwu ka e nyochaa chọpụta, e mere nyochaa, a chọpụtakwara ya nʼakwụkwọ na obodo a siterị nʼoge gara aga bụ obodo na-ebuli onwe ya megide ọtụtụ ndị eze, bụrụkwa ebe na-akpali nnupu isi na okwu na-eweta ọgbaaghara.
20 Jerusalem e nweela ụfọdụ ndị eze nke chịrị nʼIzrel, ndị dị ike a maara aha ha, ndị alaeze ha gbasara rute nʼosimiri Yufretis, ndị a na-atụkwara ụtụ dị iche iche.
21 Ugbu a, nye iwu ka ndị ikom ndị ahụ kwụsị ọrụ, ka a ghara iwuzi obodo a tutu ruo mgbe m ga-enye iwu.
22 Lezienụ anya ka unu ghara i lepụrụ okwu a anya. Gịnị ga-eme ka a hapụ ihe iyi egwu a ka ọ gaa nʼihu, ime ka ihe jọrọ alaeze a njọ karịa?
23 Ngwangwa a gụrụ akwụkwọ ozi si nʼaka eze Ataksekses, nye Rehum na Shimshai bụ ode akwụkwọ, na ndị otu ha, ha mere ọsịịsọ gakwuru ndị Juu na Jerusalem jiri ike kwagide ha ka ha kwụsị ịrụ ọrụ ahụ.
24 Ya mere, ha kwụsịrị ịrụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Chineke na Jerusalem tutu ruo nʼafọ abụọ nke ọchịchị Daraiọs eze Peshịa.
Read Ezra 4 in the app The whole chapter