The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Ezekiel 39

Ezekiel 39:21

“Mgbe ahụ, aga m egosi ebube m na nsọpụrụ m nʼetiti mba niile dị iche iche. Mba niile ga-ahụkwa ahụhụ nke m tara ha, na aka m nke m tụkwasịrị ha.

Ezekiel 39:21 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Ezekiel 39Next →

Ezekiel 39:21 in other translations

KJV King James Version

And I will set my glory among the heathen, and all the heathen shall see my judgment that I have executed, and my hand that I have laid upon them.

BSB Berean Standard Bible

I will display My glory among the nations, and all the nations will see the judgment that I execute and the hand that I lay upon them.

WEB World English Bible

“I will set my glory among the nations. Then all the nations will see my judgment that I have executed, and my hand that I have laid on them.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

18 Anụ ahụ ndị dị ike ka unu ga-eri, ọ bụkwa ọbara ndịisi niile nke ụwa ka unu ga-aṅụ, dịka a ga-asị na ha bụ ebule na ụmụ atụrụ, na mkpi, na oke ehi, anụ mara abụba nke si na Bashan.

19 Unu ga-erijukwa abụba afọ, ṅụbigakwa ọbara oke ruo mgbe ọ ga-ebu unu, site nʼaja mmemme nke m na-achụ nʼihi unu.

20 Afọ anụ ịnyịnya, na ụgbọala, na nke ndị dike, na nke ndị agha niile ga-eju unu na tebul m.’ Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.

21 “Mgbe ahụ, aga m egosi ebube m na nsọpụrụ m nʼetiti mba niile dị iche iche. Mba niile ga-ahụkwa ahụhụ nke m tara ha, na aka m nke m tụkwasịrị ha.

22 Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ụlọ Izrel ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha.

23 Mba niile ga-amatakwa na ọ bụ nʼihi mmehie ka e ji dọta Izrel nʼagha, buru ha jee mba dị iche iche. Ha ga-amata na ihe dị otu a dakwasịrị ha nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha. Ọ bụ nʼihi ya ka m ji zoo ihu m site nʼebe ha nọ, were ha nyefee nʼaka ndị iro ha. Ha niile dakwara site na mma agha.

24 Atara m ha ahụhụ dịka adịghị ọcha ha na ajọ omume ha si dị. Ezokwara m ihu m site nʼebe ha nọ.

Read Ezekiel 39 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV