The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Ezekiel 23

Ezekiel 23:21

Ya bụ, na-agụụ ndụ ọjọọ nke i biri mgbe ị bụ agbọghọ na-agụsị gị ike, mgbe ị nọ nʼIjipt ebe a na-abịagide gị aka nʼara, ebe apịkwara ọnụ ara nta gị aka.

Ezekiel 23:21 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Ezekiel 23Next →

Ezekiel 23:21 in other translations

KJV King James Version

Thus thou calledst to remembrance the lewdness of thy youth, in bruising thy teats by the Egyptians for the paps of thy youth.

BSB Berean Standard Bible

So you revisited the indecency of your youth, when the Egyptians caressed your bosom and pressed your young breasts.

WEB World English Bible

Thus you called to memory the lewdness of your youth, in the caressing of your nipples by the Egyptians because of your youthful breasts.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

18 Mgbe ọ gara nʼihu na-akwa iko nʼezoghị ezo na-ekpughekwa ọtọ ya, elepụrụ m ya anya nʼihi ịsọ oyi, dịka m mere lepụkwara anya site nʼebe nwanne ya nwanyị nọ.

19 Ma ọ gara nʼihu na-akwa iko karịa, dịka ọ na-echeta ndụ akwụna o biri nʼIjipt mgbe ọ bụ agbọghọ.

20 Nʼebe ahụ, agụụ ndị ikom ya na ha na-akwa iko gụrụ ya, bụ ndị anụahụ ha dịka nke ịnyịnya ibu, ndị ihe ha na-anyụpụta dịkwa ka nke ịnyịnya.

21 Ya bụ, na-agụụ ndụ ọjọọ nke i biri mgbe ị bụ agbọghọ na-agụsị gị ike, mgbe ị nọ nʼIjipt ebe a na-abịagide gị aka nʼara, ebe apịkwara ọnụ ara nta gị aka.

22 “Nʼihi nke a, gị Oholiba, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Aga m akpali ndị ahụ hụrụ gị nʼanya megide gị, bụ ndị ahụ ihe ha na-amasịkwaghị gị ọzọ. Aga m esi nʼakụkụ niile kpọta ha, megide gị.

23 Ndị Babilọn, ndị Kaldịa niile, ndị ikom Pekod, ndị Shoa, na ndị Koa, na ndị Asịrịa niile ha na ha soo. Ụmụ okorobịa niile dị mma ile anya, ha niile bụ ndị na-achị achị na ndị ọchịagha, ndịisi na-agba ịnyịnya, na ndị ikom ọkwa ha dị elu, ha niile ga-anọkwasị nʼelu ịnyịnya.

24 Ha ga-eji ngwa agha dị iche iche, ụgbọala nke agha na ọtụtụ igwe ndị mmadụ dị iche iche; ha ji ọta ukwu na ọta nta, kpurukwa okpu agha igwe, were ọnọdụ gburugburu gị nʼakụkụ ọbụla, imegide gị. Aga m enyefe gị nʼaka ha, ka ha taa gị ahụhụ, ha ga-atakwa gị ahụhụ dịka usoro ikpe ha si dị.

Read Ezekiel 23 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV