The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Exodus 7
Nʼoge a, mgbe ha gwara Fero okwu, Mosis agbaala iri afọ asatọ. Ma Erọn agbaala iri afọ asatọ na atọ.
Exodus 7:7 · Baịbụlụ Nsọ
And Moses was fourscore years old, and Aaron fourscore and three years old, when they spake unto Pharaoh.
Moses was eighty years old and Aaron was eighty-three when they spoke to Pharaoh.
Moses was eighty years old, and Aaron eighty-three years old, when they spoke to Pharaoh.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
4 ma Fero agaghị ege unu ntị. Mgbe ahụ aga m eme ka aka m bịakwasị Ijipt. Aga m esite nʼoke ọrụ nke ikpe ọmụma dị oke egwu, mee ka ndị m, Izrel, dịka usuu ha niile si dị, site nʼala Ijipt pụọ.
5 Ndị Ijipt ga-amata nʼezie na m bụ Onyenwe anyị, mgbe m setịpụrụ aka nʼIjipt, ma site nʼetiti ha kpọpụta ụmụ Izrel.”
6 Mosis na Erọn mere dịka Onyenwe anyị nyere ha iwu.
7 Nʼoge a, mgbe ha gwara Fero okwu, Mosis agbaala iri afọ asatọ. Ma Erọn agbaala iri afọ asatọ na atọ.
8 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn sị,
9 “Mgbe Fero ga-agwa unu okwu sị, ‘Meenụ ihe ebube.’ Ị ga-agwa Erọn okwu sị ya, ‘Were mkpanaka gị tụpụ ya nʼala nʼihu Fero.’ Ọ ga-aghọ agwọ.”
10 Mgbe ahụ, Mosis na Erọn jekwuuru Fero mee dịka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu. Erọn tụpụrụ mkpanaka ya nʼala nʼihu Fero na ndị ozi ya. Ọ ghọrọ agwọ.
Read Exodus 7 in the app The whole chapter