The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Exodus 5
Ndị nlekọta ọrụ ndị a gwara Mosis na Erọn okwu sị, “Ka Onyenwe anyị lee unu anya ma kpee unu ikpe. Unu emeela ka anyị bụrụ ihe na-esi ajọ isi nʼihu Fero na ndị na-ejere ya ozi. Unu etinyela mma agha nʼaka ha nke ha ga-eji gbuo anyị.”
Exodus 5:21 · Baịbụlụ Nsọ
And they said unto them, The LORD look upon you, and judge; because ye have made our savour to be abhorred in the eyes of Pharaoh, and in the eyes of his servants, to put a sword in their hand to slay us.
“May the LORD look upon you and judge you,” the foremen said, “for you have made us a stench before Pharaoh and his officials; you have placed in their hand a sword to kill us!”
They said to them, “May the LORD look at you and judge, because you have made us a stench to be abhorred in the eyes of Pharaoh, and in the eyes of his servants, to put a sword in their hand to kill us!”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
18 Laghachinụ azụ ugbu a nʼọrụ unu. A gaghị enye unu okporo ahịhịa ọbụla. Ma unu ga-arụpụtarịrị ọnụọgụgụ brik dị ka a chọrọ nʼaka unu.”
19 Ndịisi ọrụ ụmụ Izrel ghọtara na ha nọ na nsogbu mgbe a gwara ha okwu sị ha, “Unu ga-akpụtarịrị ọnụọgụgụ brik unu kwesiri ịkpụ kwa ụbọchị.”
20 Mgbe ha si nʼihu Fero pụọ, ha zutere Mosis na Erọn ebe ha nọ na-eche ha.
21 Ndị nlekọta ọrụ ndị a gwara Mosis na Erọn okwu sị, “Ka Onyenwe anyị lee unu anya ma kpee unu ikpe. Unu emeela ka anyị bụrụ ihe na-esi ajọ isi nʼihu Fero na ndị na-ejere ya ozi. Unu etinyela mma agha nʼaka ha nke ha ga-eji gbuo anyị.”
22 Mgbe ahụ Mosis laghachikwuru Onyenwe anyị jụọ ya sị, “Onyenwe anyị, gịnị mere i ji butere ndị a nsogbu? Gịnị mere i ji zite m?
23 Nʼihi na site na mgbe m jekwuuru Fero gwa ya okwu nʼaha gị, o meela ka nsogbu dakwasị ndị a, ma ị napụtabeghị ndị gị.”
Read Exodus 5 in the app The whole chapter