The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Exodus 34

Exodus 34:32

Mgbe e mesịrị, ndị Izrel niile bịakwutere ya. O nyekwara ha iwu ndị ahụ Onyenwe anyị nyere ya nʼelu ugwu Saịnaị.

Exodus 34:32 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Exodus 34Next →

Exodus 34:32 in other translations

KJV King James Version

And afterward all the children of Israel came nigh: and he gave them in commandment all that the LORD had spoken with him in mount Sinai.

BSB Berean Standard Bible

And after this all the Israelites came near, and Moses commanded them to do everything that the LORD had told him on Mount Sinai.

WEB World English Bible

Afterward all the children of Israel came near, and he gave them all the commandments that the LORD had spoken with him on Mount Sinai.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

29 Mgbe Mosis ji mbadamba nkume abụọ nke ihe ama ahụ na-arịdata site nʼelu ugwu ahụ, ọ mataghị na ihu ya na-egbuke egbuke, nʼihi ọnọdụ nke ọ nọrọ nʼihu Onyenwe anyị.

30 Nʼihi mgbuke ahụ ihu Mosis na-egbuke, ụjọ ekweghị Erọn na ụmụ Izrel bịaruo ya nso.

31 Ma Mosis kpọrọ ha ka ha bịakwute ya. Nʼihi ya, Erọn na ndị ndu nzukọ Izrel bịara ka ha na Mosis kparịtaa ụka.

32 Mgbe e mesịrị, ndị Izrel niile bịakwutere ya. O nyekwara ha iwu ndị ahụ Onyenwe anyị nyere ya nʼelu ugwu Saịnaị.

33 Mgbe Mosis gwachara ha okwu, o weere akwa kpuchie ihu ya.

34 Ma mgbe ọbụla ọ na-abanye nʼihu Onyenwe anyị ka ha kparịtaa ụka nʼime ụlọ nzute ahụ, ọ na-ekepụ akwa ahụ o ji kpuchie ihu ya tutu ruo mgbe ọ nọchara pụta. Mgbe ọ pụtara, ọ na-agwa ndị Izrel ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.

35 Ha hụkwara na ihu ya na akpụkpọ ihu ya na-egbuke egbuke. Emesịa, Mosis na-ekpuchikwa ihu ya tutu ruo mgbe ọ ga-abanye nʼime ka ya na Onyenwe anyị kparịta ụka.

Read Exodus 34 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV