The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Exodus 32
Mgbe Erọn hụrụ na ụmụ Izrel jupụtara nʼobi aṅụrị, nʼihi ihe ahụ ọ kpụrụ, o wuru ebe ịchụ aja nʼihu nwa ehi ahụ ọ kpụrụ, kwuo okwu sị, “Echi, a ga-enwe oke mmemme nye Onyenwe anyị!”
Exodus 32:5 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Exodus 32Next →
And when Aaron saw it, he built an altar before it; and Aaron made proclamation, and said, To morrow is a feast to the LORD.
When Aaron saw this, he built an altar before the calf and proclaimed: “Tomorrow shall be a feast to the LORD.”
When Aaron saw this, he built an altar before it; and Aaron made a proclamation, and said, “Tomorrow shall be a feast to the LORD.”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
2 Erọn zara sị ha, “Yipụtanụ ọlantị ọlaedo ndị nwunye unu, na ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom yi. Wetara m ha.”
3 Ngwangwa, ha niile yipụrụ ọlantị ha weta ha nye Erọn.
4 Ọ naara ya nʼaka ha, were ngwa ọrụ e ji egbunye akara, kpụtara ha arụsị nwa oke ehi. Mgbe ahụ, ha kwuru sị, “Ndị Izrel, ndị a bụ chi unu, nke sitere nʼala Ijipt dupụta unu.”
5 Mgbe Erọn hụrụ na ụmụ Izrel jupụtara nʼobi aṅụrị, nʼihi ihe ahụ ọ kpụrụ, o wuru ebe ịchụ aja nʼihu nwa ehi ahụ ọ kpụrụ, kwuo okwu sị, “Echi, a ga-enwe oke mmemme nye Onyenwe anyị!”
6 Ya mere na echi ya, ha biliri nʼoge, bido ịchụ aja nsure ọkụ, na aja udo, nye nwa ehi ahụ a kpụrụ akpụ. Mgbe nke a gasịrị, ha nọdụrụ ala iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, biliekwa ọtọ gwurie egwu ime onwe ha obi ụtọ.
7 Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Gbada ọsịịsọ, nʼihi na ndị gị, ndị i dupụtara site nʼIjipt emerụọla onwe ha.
8 Nʼotu ntabi anya a, ha ahapụla ụzọ m niile. Ha akpụọlara onwe ha arụsị nwa oke ehi, nke ha na-efe ofufe, nke ha chụkwaara aja nye. Ha kwukwara sị, ‘Ndị Izrel, ndị a bụ chi unu, nke dupụtara unu site nʼala Ijipt.’ ”
Read Exodus 32 in the app The whole chapter