The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Exodus 29

Exodus 29:4

Kpọpụta Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, jiri mmiri saa ha ahụ.

Exodus 29:4 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Exodus 29Next →

Exodus 29:4 in other translations

KJV King James Version

And Aaron and his sons thou shalt bring unto the door of the tabernacle of the congregation, and shalt wash them with water.

BSB Berean Standard Bible

Then present Aaron and his sons at the entrance to the Tent of Meeting and wash them with water.

WEB World English Bible

You shall bring Aaron and his sons to the door of the Tent of Meeting, and shall wash them with water.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

1 “Nke a ga-abụ usoro mmemme nke ị ga-eme, iji doo Erọn na ụmụ ya ndị ikom nsọ, ka ha na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja. Were nwa oke ehi na ebule abụọ nke na-enweghị ntụpọ ọbụla.

2 Werekwa ọka wiiti a kwọrọ nke ọma, mee achịcha nke na-enweghị ihe na-eko achịcha e tinyere nʼime ha, achịcha mbadamba na-ekoghị eko nke e ji mmanụ oliv gwakọtaa, ya na achịcha mbadamba ọzọ dị nta na-ekoghị eko nke e tere mmanụ nʼahụ ya.

3 Mgbe ahụ, ị ga-etinye achịcha ndị a niile nʼime otu nkata, bute ha nʼime nkata ahụ, wetakwa nwa oke ehi, na ebule abụọ.

4 Kpọpụta Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, jiri mmiri saa ha ahụ.

5 Yikwasị Erọn uwe ime ahụ, uwe mwụda nke efọọd, efọọd ahụ na ihe mgbochi obi. Were ihe okike efọọd ahụ nke akpaziri nke ọma kegide ya efọọd ahụ nʼahụ.

6 Tụhịakwa akwa ike nʼisi ahụ nʼisi ya. Tinye okpu nsọ ahụ nʼelu akwa ike nʼisi ahụ.

7 Werekwa mmanụ nsọ ahụ, tee ya, site nʼịwụkwasị ya nʼisi ya.

Read Exodus 29 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV