The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Exodus 29

Exodus 29:39

Chụọ otu nʼoge ụtụtụ; chụọkwa nke ọzọ nʼoge uhuruchi.

Exodus 29:39 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Exodus 29Next →

Exodus 29:39 in other translations

KJV King James Version

The one lamb thou shalt offer in the morning; and the other lamb thou shalt offer at even:

BSB Berean Standard Bible

Offer one lamb in the morning and the other at twilight.

WEB World English Bible

The one lamb you shall offer in the morning; and the other lamb you shall offer at evening;

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

36 Ị ga-achụ aja oke ehi dịka aja mmehie maka ikpuchi mmehie kwa ụbọchị. Ị ga-emekwa ka ebe ịchụ aja m dị ọcha, site nʼịchụ aja mkpuchi mmehie nʼelu ya, na ite ya mmanụ nʼihi iji doo ya nsọ.

37 Ụbọchị asaa ka ị ga-edo ebe ịchụ aja nsọ site nʼịchụ aja mkpuchi mmehie. Mgbe ahụ ebe ịchụ aja ga-abụ ebe dịkarịsịrị nsọ. Ihe ọbụla metụrụ ebe ịchụ aja ahụ ga-adị nsọ.

38 “Ma nke a bụ ihe ị ga-achụ nʼelu ebe ịchụ aja kwa ụbọchị, ị ga-eji ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ chụọ aja.

39 Chụọ otu nʼoge ụtụtụ; chụọkwa nke ọzọ nʼoge uhuruchi.

40 Ị ga-ewere nwa atụrụ, tinyere lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri akwọzi nke a gwọkọtara nʼotu lita mmanụ oliv asụrụ asụ, chụọ aja. Wetakwa otu lita mmanya dịka aja ihe ọṅụṅụ.

41 Jirikwa nwa atụrụ nke ọzọ, ya na otu ụdị aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ ya dịka i mere nʼụtụtụ. Aja isisi ya dị ezi mma, nke e sitere nʼọkụ a na-achụ nye Onyenwe anyị.

42 “A ga na-achụ aja nsure ọkụ a oge niile nʼọgbọ niile, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute m ka a ga-achụ ya, nʼihu Onyenwe anyị. Nʼihi nʼebe ahụ ka m ga-ezute gị gwa gị okwu.

Read Exodus 29 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV