The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Exodus 29
Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eri anụ ebule ahụ, na achịcha ndị ahụ dị nʼime nkata nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
Exodus 29:32 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Exodus 29Next →
And Aaron and his sons shall eat the flesh of the ram, and the bread that is in the basket, by the door of the tabernacle of the congregation.
At the entrance to the Tent of Meeting, Aaron and his sons are to eat the meat of the ram and the bread that is in the basket.
Aaron and his sons shall eat the meat of the ram, and the bread that is in the basket, at the door of the Tent of Meeting.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
29 “Uwe nsọ Erọn ndị a niile ka a ga-edebe nʼihi mmemme ido nsọ. A ga-eji ha na-edo ụmụ ya nsọ bụ ndị ga-anọchi anya ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
30 Nwa ya nwoke ọbụla nke nọchiri anya ya dịka onye nchụaja, nke bịara nʼụlọ nzute m ije ozi nʼEbe Nsọ ga-eyi uwe ndị a ụbọchị asaa.
31 “Were anụ ebule ido nsọ ahụ, sienụ anụ ahụ nʼebe dị nsọ.
32 Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eri anụ ebule ahụ, na achịcha ndị ahụ dị nʼime nkata nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
33 Ha ga-eri ihe ndị aja niile ahụ nke e ji chụọ aja mkpuchi mmehie, nʼoge ido nsọ ha. Ọ dịghị onye ọbụla ọzọ ga-eso ha rie ya, nʼihi na ha bụ ihe dị nsọ.
34 Ọ bụrụ na ụfọdụ nʼime anụ na achịcha ido nsọ ndị ahụ afọdụ ruo ụtụtụ, a ga-akpọ ha ọkụ. A gaghị eri ya ọzọ, nʼihi na ọ bụ ihe dị nsọ.
35 “Ọ bụ otu a ka a ga-esi doo Erọn na ụmụ ya ndị ikom nsọ, dịka ihe niile m nyere gị nʼiwu si dị. Ọ ga-ewe ụbọchị asaa iji doo ha nsọ.
Read Exodus 29 in the app The whole chapter