The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Exodus 29

Exodus 29:21

Ị ga-esite nʼelu ebe ịchụ aja were ụfọdụ ọbara, ya na ụfọdụ mmanụ nsọ, fesa ya nʼahụ Erọn na nʼelu uwe ya, nʼahụ ụmụ ya ndị ikom, nakwa nʼelu uwe ha niile. Mgbe ahụ, ya na ụmụ ya ndị ikom ga-abụ ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị, ha na uwe ha.

Exodus 29:21 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Exodus 29Next →

Exodus 29:21 in other translations

KJV King James Version

And thou shalt take of the blood that is upon the altar, and of the anointing oil, and sprinkle it upon Aaron, and upon his garments, and upon his sons, and upon the garments of his sons with him: and he shall be hallowed, and his garments, and his sons, and his sons' garments with him.

BSB Berean Standard Bible

And take some of the blood on the altar and some of the anointing oil and sprinkle it on Aaron and his garments, as well as on his sons and their garments. Then he and his garments will be consecrated, as well as his sons and their garments.

WEB World English Bible

You shall take of the blood that is on the altar, and of the anointing oil, and sprinkle it on Aaron, and on his garments, and on his sons, and on the garments of his sons with him: and he shall be made holy, and his garments, and his sons, and his sons’ garments with him.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

18 Kpọọ ebule ahụ niile ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Ọ bụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, nke isisi ya dị ezi mma. Aja a chụrụ nye Onyenwe anyị site nʼọkụ.

19 “Were ebule nke ọzọ, ka Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-ebikwasị aka ha nʼelu isi ya.

20 Gbuo ya. Were ụfọdụ nʼime ọbara ya tee Erọn na ụmụ ya nʼọnụ ntị aka nri ha, na isi mkpụrụ aka nke aka nri ha, ya na isi mkpụrụ ụkwụ nke ụkwụ aka nri ha. Werekwa ọbara nke fọdụrụ fesaa nʼakụkụ ya niile nke ebe ịchụ aja ahụ.

21 Ị ga-esite nʼelu ebe ịchụ aja were ụfọdụ ọbara, ya na ụfọdụ mmanụ nsọ, fesa ya nʼahụ Erọn na nʼelu uwe ya, nʼahụ ụmụ ya ndị ikom, nakwa nʼelu uwe ha niile. Mgbe ahụ, ya na ụmụ ya ndị ikom ga-abụ ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị, ha na uwe ha.

22 “Were abụba ebule ahụ, na akụkụ ọdụdụ ya nwere abụba, na abụba nke kpuchiri ime ya, mba-umeju nke dị nʼumeju ya, akụrụ ya abụọ na abụba gbara ha gburugburu, na apata aka nri ya (nʼihi na ebule ahụ bụ ebule ido nsọ),

23 site na nkata achịcha ahụ a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke na-adị nʼihu Onyenwe anyị. Were otu achịcha dị gburugburu, otu ogbe achịcha a gwakọtara mmanụ oliv, na otu mbadamba ogbe achịcha,

24 tinye ihe ndị a niile nʼaka Erọn na ụmụ ya ndị ikom, mee ka ha fufee ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.

Read Exodus 29 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV