The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Exodus 28
Ọ ga-enwe oghere nʼetiti ya ebe a ga-esi na-etinye isi. A ga-enwe ihe ọkpụkpa gburugburu oghere a dịka nke olu uwe agha, ime ka o sie ike, ghara ịdọka.
Exodus 28:32 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Exodus 28Next →
And there shall be an hole in the top of it, in the midst thereof: it shall have a binding of woven work round about the hole of it, as it were the hole of an habergeon, that it be not rent.
with an opening at its top in the center. Around the opening shall be a woven collar with an opening like that of a garment, so that it will not tear.
It shall have a hole for the head in the middle of it. It shall have a binding of woven work around its hole, as it were the hole of a coat of mail, that it not be torn.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
29 “Nʼụzọ dị otu a, mgbe ọbụla Erọn banyere nʼEbe Nsọ, ọ ga-ebu aha ụmụ ndị ikom Izrel niile nʼelu obi ya, nʼelu ihe mgbochi obi nke ikpe ahụ, dịka ihe ncheta nʼihu Onyenwe anyị mgbe niile.
30 Ị ga-etinyekwa nʼime ihe mgbochi obi ahụ ụmụ nkume abụọ e ji ajụta ase nke bụ Urim na Tumim. Ha ga-adị nʼelu obi Erọn mgbe ọbụla ọ gara nʼihu Onyenwe anyị. Otu a kwa, Erọn ga-ebukwa ihe e ji ajụta ase banyere ndị Izrel nʼelu obi ya mgbe niile, nʼihu Onyenwe anyị.
31 “Ọ bụ akwa nke na-acha anụnụ anụnụ, ka ị ga-eji dụọ uwe mwụda efọọd ahụ.
32 Ọ ga-enwe oghere nʼetiti ya ebe a ga-esi na-etinye isi. A ga-enwe ihe ọkpụkpa gburugburu oghere a dịka nke olu uwe agha, ime ka o sie ike, ghara ịdọka.
33 Nʼọnụ ala ala uwe ahụ gburugburu, ị ga-akpanye ihe ọkpụkpa oyiyi mkpụrụ pomegranet. Ọ bụ ogho nke na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie ka ị ga-eji. Ị ga-akpanyekwa ataṅụ ọlaedo nʼetiti ha.
34 Nʼọnụ ọnụ ala uwe mwụda ahụ, a ga-adụnye otu ataṅụ ọlaedo, otu oyiyi mkpụrụ pomegranet, gbaa gburugburu.
35 Mgbe ọbụla Erọn na-eje ozi ya, ọ ghaghị iyi ya. Aga na anụ mgbịrịgba ataṅụ ahụ ka ọ na-akụ, mgbe ọ banyere nʼEbe Nsọ ahụ nʼihu Onyenwe anyị, na mgbe o si nʼebe ahụ na-apụta, ka ọ ghara ịnwụ.
Read Exodus 28 in the app The whole chapter