The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Exodus 24
Mosis biliri, ya na Joshua onye na-agara ya ozi. Mosis nʼonwe ya rigokwara nʼelu ugwu Chineke.
Exodus 24:13 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Exodus 24Next →
And Moses rose up, and his minister Joshua: and Moses went up into the mount of God.
So Moses set out with Joshua his attendant and went up on the mountain of God.
Moses rose up with Joshua, his servant, and Moses went up onto God’s Mountain.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
10 Ha hụrụ Chineke nke Izrel. Nʼokpuru ụkwụ ya abụọ, e were ihe dịka ebe nzọkwasị ụkwụ nke e ji nkume safaia mee. Nkume ndị a na-enwukwa ezi onwunwu dịka mbara eluigwe.
11 Ọ bụ ezie na ndị okenye Izrel hụrụ Chineke anya ma ọ laghị ha nʼiyi. Kama o mere ka ha nọọ nʼihu ya rie, ṅụọ.
12 Mgbe nke a gasịrị, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Rigota, bịakwute m nʼelu ugwu, nọdụkwa ebe ahụ, maka na aga m enye gị mbadamba nkume nke iwu na ụkpụrụ dị na ya, nke m ji aka m dee maka i ji kuziere ha.”
13 Mosis biliri, ya na Joshua onye na-agara ya ozi. Mosis nʼonwe ya rigokwara nʼelu ugwu Chineke.
14 Ọ gwara ndị okenye Izrel okwu sị, “Cherenụ anyị nʼebe a tutu ruo mgbe anyị ga-alaghachikwute unu. Unu na Erọn na Hua nọ, onye ọbụla nwere nsogbu jekwuru ha.”
15 Ngwangwa, Mosis rigoro nʼelu ugwu ahụ, oke igwe ojii kpuchiri ugwu ahụ niile,
16 ebube Onyenwe anyị kpuchikwara elu ugwu ahụ. Ọ bụ ụbọchị isii ka igwe ojii kpuchiri ugwu ahụ. Nʼụbọchị nke asaa, Onyenwe anyị sitere nʼetiti igwe ojii ahụ kpọọ Mosis oku.
Read Exodus 24 in the app The whole chapter