The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Exodus 22
Ọ bụrụ na anụ ọhịa gburu ya, ọ ga-eweta ụfọdụ nʼime anụ ahụ a dọgburu adọgbu, iji gosi na anụ ọhịa dọgburu ya. Ọ ga-esikwa otu a gbanarị ikpe ọmụma. Nʼihi nke a, ọ gaghị akwụkwa ụgwọ ọbụla nʼihi anụ ụlọ ahụ.
Exodus 22:13 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Exodus 22Next →
If it be torn in pieces, then let him bring it for witness, and he shall not make good that which was torn.
If the animal was torn to pieces, he shall bring it as evidence; he need not make restitution for the torn carcass.
If it is torn in pieces, let him bring it for evidence. He shall not make good that which was torn.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
10 “Ọ bụrụ na anụ ụlọ mmadụ nyere onye agbataobi ya nʼaka idebe anwụọ, maọbụ merụọ ahụ, maọbụ gbafuo, ma anụ ụlọ ahụ ọ bụ ịnyịnya ibu, maọbụ ehi, maọbụ atụrụ, maọbụ anụ ụlọ ọzọ, ọ bụrụ na ọ dịghị onye hụrụ mgbe ihe ndị a dakwasịrị anụ ụlọ ahụ,
11 mgbe ahụ, onye agbataobi ahụ e nyere anụ ndị a nʼaka idebe ga-aṅụ iyi nʼihu Onyenwe anyị. Iyi ahụ ọ ṅụrụ ga-egosi onyenwe anụ ụlọ ahụ na o zughị ya nʼohi. Nʼihi nke a, ọ gaghị akwụghachi ụgwọ ọbụla.
12 Ma ọ bụrụ na o zuru anụ ụlọ ahụ nʼohi site na nke agbataobi ya, ọ ghaghị ịkwụghachi ụgwọ niile nye onyenwe ya.
13 Ọ bụrụ na anụ ọhịa gburu ya, ọ ga-eweta ụfọdụ nʼime anụ ahụ a dọgburu adọgbu, iji gosi na anụ ọhịa dọgburu ya. Ọ ga-esikwa otu a gbanarị ikpe ọmụma. Nʼihi nke a, ọ gaghị akwụkwa ụgwọ ọbụla nʼihi anụ ụlọ ahụ.
14 “Ọ bụrụ na mmadụ agbaziri anụ ụlọ site nʼaka onye agbataobi ya, ọ bụrụ na anụ ụlọ ahụ anwụọ, maọbụ merụọ ahụ mgbe onyenwe ya na-anọghị nʼebe ahụ, onye ahụ a gbazinyere anụ ụlọ ahụ ga-akwụ ụgwọ ya.
15 Ọ bụrụ na anụ ụlọ ahụ nọ na nke onyenwe ya, onye gbaziri ya agaghị akwụ ụgwọ ọbụla. Ọ bụrụ na a kwụrụ ego mgbazi ọbụla nʼisi anụmanụ a, onye gbaziri ya agaghị akwụghachi ego ọbụla, nʼihi na ego mgbazi ọ kwuru ka a ga-ewere dịka ụgwọ.
16 “Ọ bụrụ na nwoke arafuo nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, site nʼime ka ha abụọ dinaa, nwoke ahụ ga-akwụ ụgwọ isi nwaagbọghọ ahụ. Ọ ga-alụkwa ya dịka nwunye ya.
Read Exodus 22 in the app The whole chapter