The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Exodus 2
Mosis nabatara oku ahụ Reuel kpọrọ ya ka ha na ya biri. O sokwara ha biri. Reuel kpọnyere Mosis Zipọra, otu nwa ya nwanyị, ka ọ bụrụ nwunye ya.
Exodus 2:21 · Baịbụlụ Nsọ
And Moses was content to dwell with the man: and he gave Moses Zipporah his daughter.
Moses agreed to stay with the man, and he gave his daughter Zipporah to Moses in marriage.
Moses was content to dwell with the man. He gave Moses Zipporah, his daughter.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
18 Ha lọghachikwutere nna ha, Reuel, onye jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji lọta nʼoge taa?”
19 Ha zara nna ha sị, “Otu onye Ijipt napụtara anyị site nʼaka ndị ọzụzụ atụrụ. O setaara anyị mmiri, nyekwa igwe anụ ụlọ anyị mmiri.”
20 Nna ha jụrụ ha sị, “Olee ebe ọ nọ? Gịnị mere unu ji hapụ ya nʼebe ahụ? Gaanụ kpọọ ya ka o soro anyị rie nri.”
21 Mosis nabatara oku ahụ Reuel kpọrọ ya ka ha na ya biri. O sokwara ha biri. Reuel kpọnyere Mosis Zipọra, otu nwa ya nwanyị, ka ọ bụrụ nwunye ya.
22 Zipọra mụtara nwa nwoke, onye Mosis kpọrọ aha ya Geshọm. Nʼihi na Mosis sịrị, “Abụ m onye ọbịa nʼala ndị ọzọ.”
23 O ruo, mgbe ọtụtụ ụbọchị gara, Fero eze Ijipt nwụrụ. Nʼoge a, ụmụ Izrel nọ na-asụ ude nʼime ọnọdụ ịbụ ohu ha. Ha kwara akwa nke ukwuu. Akwa ha kwara ka e nyere ha aka nʼihi ọnọdụ ịbụ ohu ha ruru Chineke ntị.
24 Chineke nụrụ ịsụ ude ha. O chetara ọgbụgba ndụ ahụ ya na Ebraham, na Aịzik, na Jekọb gbara.
Read Exodus 2 in the app The whole chapter