The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Exodus 19
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Rịda gaa dọọ ndị mmadụ ahụ aka na ntị ka ha ghara ịgafe oke ala ahụ bịaruo nso ịhụ Onyenwe anyị anya ka ha ghara ịla nʼiyi.
Exodus 19:21 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Exodus 19Next →
And the LORD said unto Moses, Go down, charge the people, lest they break through unto the LORD to gaze, and many of them perish.
and the LORD said to him, “Go down and warn the people not to break through to see the LORD, lest many of them perish.
The LORD said to Moses, “Go down, warn the people, lest they break through to the LORD to gaze, and many of them perish.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
18 Mgbe ahụ, anwụrụ ọkụ kpuchiri ugwu Saịnaị. Ma lee! Onyenwe anyị rịdatara dịka ire ọkụ nʼelu ugwu ahụ. Anwụrụ ọkụ rigoro elu dịka anwụrụ ọkụ nke ọhịa na-ere ọkụ. Ala ọma jijiji dị ukwuu dakwasịkwara ugwu ahụ.
19 Mgbe opi ike ahụ na-ada ike ike, Mosis malitere ịgwa Chineke okwu. Chineke zaghachiri Mosis okwu site nʼolu dara ụda dịka egbe eluigwe.
20 Onyenwe anyị rịdatara bịaruo nʼelu ugwu Saịnaị. Ọ gwara Mosis ka ọ rịgota bịa zute ya. Mosis rigoro nʼelu ugwu ahụ ijekwuru Chineke.
21 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Rịda gaa dọọ ndị mmadụ ahụ aka na ntị ka ha ghara ịgafe oke ala ahụ bịaruo nso ịhụ Onyenwe anyị anya ka ha ghara ịla nʼiyi.
22 Ọ bụladị ndị nchụaja ndị chọrọ ịbịaru Onyenwe anyị nso aghaghị ido onwe ha nsọ. Ma ọ bụghị otu a, Onyenwe anyị ga-eme ka ha niile nwụọ.”
23 Mosis zaghachiri Onyenwe anyị sị, “Ndị mmadụ agaghị arịgota nʼugwu Saịnaị nʼihi na gị onwe gị adọọla anyị aka na ntị sị, ‘Kpaanụ oke gburugburu ugwu a, doo ya nsọ.’ ”
24 Ma Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị: “Gbada gaa kpọgota Erọn ka gị na ya soro rigota nʼelu ugwu a. Ma lezie anya ka ndị nchụaja na ndị Izrel ghara irigota nʼebe a ịbịakwute Onyenwe anyị, ma ọ bụghị otu a, ọ ga-eji ike laa ha nʼiyi.”
Read Exodus 19 in the app The whole chapter