The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Exodus 13
“Nʼoge dị nʼihu, mgbe nwa gị nwoke ga-ajụ gị sị, ‘Gịnị ka ihe ndị a pụtara?’ Ị ga-azaghachi ya sị, ‘Onyenwe anyị jiri aka ike dị ukwu dupụta anyị site nʼIjipt, site nʼala nke ohu.
Exodus 13:14 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Exodus 13Next →
And it shall be when thy son asketh thee in time to come, saying, What is this? that thou shalt say unto him, By strength of hand the LORD brought us out from Egypt, from the house of bondage:
In the future, when your son asks you, ‘What does this mean?’ you are to tell him, ‘With a mighty hand the LORD brought us out of Egypt, out of the house of slavery.
It shall be, when your son asks you in time to come, saying, ‘What is this?’ that you shall tell him, ‘By strength of hand the LORD brought us out from Egypt, from the house of bondage.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
11 “Mgbe Onyenwe anyị dubatara unu nʼala ndị Kenan, nyefee unu ala ahụ dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna unu ha,
12 unu ga-enyefe Onyenwe anyị ụmụ ndị ikom unu niile e bụ ụzọ mụọ. Ọzọ, ụmụ oke anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ bụ nke Onyenwe anyị.
13 Jiri nwa atụrụ gbapụta nwa ịnyịnya ibu mbụ e bụ ụzọ mụọ. Ọ bụrụ na unu achọghị ịgbara nwa ịnyịnya ibu ahụ, unu aghaghị ịgbaji ya olu. Ma unu aghaghị ịgbara ụmụ ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ.
14 “Nʼoge dị nʼihu, mgbe nwa gị nwoke ga-ajụ gị sị, ‘Gịnị ka ihe ndị a pụtara?’ Ị ga-azaghachi ya sị, ‘Onyenwe anyị jiri aka ike dị ukwu dupụta anyị site nʼIjipt, site nʼala nke ohu.
15 Mgbe Fero mesiri obi ya ike, jụ ka anyị si nʼala ya pụọ, Onyenwe anyị gburu ụmụ ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, ma mmadụ ma anụ ụlọ. Nʼihi ya, ana m eji ụmụ oke anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ achụ aja nye Onyenwe anyị. Ma ụmụ m ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ ka m na-agbapụta.’
16 Mmemme a ga-adị ka ihe ịrịbama nʼanya unu, dịrịkwa ka ihe ngosi nʼegedege ihu unu, ichetara unu na Onyenwe anyị ji aka ike ya dupụta anyị site nʼala Ijipt.”
17 Mgbe Fero mesịrị kwere ka ụmụ Izrel laa, Chineke edughị ha site nʼụzọ ahụ gafere ala ndị Filistia. Ọ bụ ezie na ụzọ ahụ dị nso karịa. Chineke mere nke a nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Ọ bụrụ na ndị a ezute agha, ha nwere ike ịgbanwe obi ha tụgharịa ịlaghachi azụ nʼIjipt.”
Read Exodus 13 in the app The whole chapter