The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Exodus 10
Ọzọ, Mosis na Erọn jekwuuru Fero gwa ya sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke ndị Hibru kwuru, ‘Ọ bụ ruo olee mgbe ka ị ga-ajụ iwedata onwe gị ala nʼihu m? Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe.
Exodus 10:3 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Exodus 10Next →
And Moses and Aaron came in unto Pharaoh, and said unto him, Thus saith the LORD God of the Hebrews, How long wilt thou refuse to humble thyself before me? let my people go, that they may serve me.
So Moses and Aaron went to Pharaoh and told him, “This is what the LORD, the God of the Hebrews, says: ‘How long will you refuse to humble yourself before Me? Let My people go, so that they may worship Me.
Moses and Aaron went in to Pharaoh, and said to him, “This is what the LORD, the God of the Hebrews, says: ‘How long will you refuse to humble yourself before me? Let my people go, that they may serve me.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Jekwuru Fero nʼihi na emeela m ka obi ya, na obi ndị na-ejere ya ozi sie ike, ka m nwee ike rụọ ọrụ ịrịbama ndị a dị iche iche nʼetiti ha.
2 Nke a ga-abụ akụkọ unu ga-akọrọ ụmụ unu, na ụmụ ụmụ unu, banyere otu m si mesie ndị Ijipt ike, na otu m si rụọ ọrụ ịrịbama m nʼetiti ha, ime ka unu mata na m bụ Onyenwe anyị.”
3 Ọzọ, Mosis na Erọn jekwuuru Fero gwa ya sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke ndị Hibru kwuru, ‘Ọ bụ ruo olee mgbe ka ị ga-ajụ iwedata onwe gị ala nʼihu m? Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe.
4 Ọ bụrụ na ị jụ ikwere ka ha gaa, nʼụtụtụ echi, aga m ezite igurube nʼala Ijipt.
5 Igurube ndị a ga-ekpuchi ihu ala Ijipt niile, ka mmadụ ọbụla hapụ ịhụ ala anya. Ha ga-erichapụ ihe ndị fọdụrụ bụ nke ifufe na mkpụrụ mmiri ahụ na-emebighị, tinyere osisi niile na-eto eto nʼubi unu.
6 Ha ga-ejupụta nʼụlọ gị, na nʼụlọ ndị na-ejere gị ozi, na nʼụlọ ndị Ijipt niile. Ihe dị otu a bụ ụdị ihe na-emetụbeghị na mbụ, nke nna gị maọbụ nna nna gị ha na-ahụtụbeghị ụdị ya site na mgbe ha bidoro ibi nʼala a tutu ruo ugbu a.’ ” Mgbe ahụ, Mosis tụgharịrị hapụ Fero pụọ.
Read Exodus 10 in the app The whole chapter