The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Esther 7
mgbe ha nọ na-aṅụ mmanya, nʼụbọchị nke abụọ ahụ, eze jụrụ Esta ajụjụ sị, “Gịnị bụ arịrịọ gị, Esta, eze nwanyị? Gịnị ka ị chọrọ? Ihe ọbụla ọ bụ, aga m enye gị ya, ọ bụladị otu ọkara alaeze m.”
Esther 7:2 · Baịbụlụ Nsọ
And the king said again unto Esther on the second day at the banquet of wine, What is thy petition, queen Esther? and it shall be granted thee: and what is thy request? and it shall be performed, even to the half of the kingdom.
and as they drank their wine on that second day, the king asked once more, “Queen Esther, what is your petition? It will be given to you. What is your request? Even up to half the kingdom, it will be fulfilled.”
The king said again to Esther on the second day at the banquet of wine, “What is your petition, queen Esther? It shall be granted you. What is your request? Even to the half of the kingdom it shall be performed.”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Eze na Heman gara iri oriri ahụ Esta nwunye eze kpọrọ ha,
2 mgbe ha nọ na-aṅụ mmanya, nʼụbọchị nke abụọ ahụ, eze jụrụ Esta ajụjụ sị, “Gịnị bụ arịrịọ gị, Esta, eze nwanyị? Gịnị ka ị chọrọ? Ihe ọbụla ọ bụ, aga m enye gị ya, ọ bụladị otu ọkara alaeze m.”
3 Nʼikpeazụ, Esta nwunye eze zara sị, “Eze biko, ọ bụrụ na m ahụtala amara nʼihu gị, ọ bụrụkwa na ọ masịrị gị, zọpụta ndụ m na ndụ ndị m.
4 Nʼihi na mụ na ndị m abụrụla ndị erere ere nʼaka ndị ga-ala anyị nʼiyi. Anyị abụrụla ndị a ga-egbu, na ndị aghaghị ịla nʼiyi. A sị na e rere anyị dịka ndị ohu nwoke na nwanyị, agaara m agba nkịtị, hapụ inye gị nsogbu, ma nʼihi nʼọdịghị ihe ga-akwụ ụgwọ isogbu eze.”
5 Eze, bụ Sekses, jụrụ Esta, bụ nwunye eze, “Onye ka mmadụ ahụ bụ, olee ebe ọ nọ, bụ onye na-ezube ime ihe ọjọọ dị otu a?”
Read Esther 7 in the app The whole chapter