The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Esther 2
Nʼụzọ dị otu a, ka nwaagbọghọ ọbụla ga-adị gakwuru eze, bụ Sekses. A na-enye ya ihe ọbụla ọ chọrọ site nʼebe obibi ha nke o ji aba nʼụlọeze.
Esther 2:13 · Baịbụlụ Nsọ
Then thus came every maiden unto the king; whatsoever she desired was given her to go with her out of the house of the women unto the king's house.
When the young woman would go to the king, she was given whatever she requested to take with her from the harem to the king’s palace.
The young woman then came to the king like this: whatever she desired was given her to go with her out of the women’s house to the king’s house.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
10 Ma Esta agwabeghị onye ọbụla obodo ya maọbụ ihe banyere ezinaụlọ ya, nʼihi na Mọdekai nyere ya iwu ka ọ ghara ịgwa onye ọbụla.
11 Ụbọchị niile, Mọdekai na-abịa nʼogige ụlọ ndị inyom na-ajụ ase otu Esta mere, nʼịchọpụta otu ihe si agara ya.
12 Tupu o ruoro nwaagbọghọ ọbụla ibakwuru eze Sekses, ọ ga-anọzu ọnwa iri na abụọ nʼebe a na-achọ ya mma dịka iwu e nyere banyere ịchọ mma ndị inyom si dị. A ga-eji mmanụ máá chọọ ya mma ọnwa isii, werekwa mmanụ isi ụtọ dị iche iche, na ihe ịchọ mma ndị ọzọ kwadoo ya nʼime ọnwa isii nke ọzọ.
13 Nʼụzọ dị otu a, ka nwaagbọghọ ọbụla ga-adị gakwuru eze, bụ Sekses. A na-enye ya ihe ọbụla ọ chọrọ site nʼebe obibi ha nke o ji aba nʼụlọeze.
14 A na-eme ka ọ banye nʼụlọeze nʼanyasị, ma nʼụtụtụ, ọ na-alọghachi nʼụlọ ọzọ nke dị nʼebe ụmụ nwanyị eze bi. Nʼebe ahụ ka Shashgaz, onozi eze nọ na-elekọta ndị iko nwanyị eze. Ọ gakwaghị alọghachi nʼebe eze ọzọ karịakwa ma ihe ya ọ masịrị eze, eze akpọọ ya ka ọ bịaghachi ọzọ.
15 Mgbe oge Esta (ada Abihail, onye bụ nwanne nna Mọdekai, onye kpọọrọ nwantakịrị nwaagbọghọ a ka ọ bụrụ nwa nke ya) ga-eji gaa nʼihu eze ruru, ọ nabatara ndụmọdụ Hegai, onozi ahụ na-elekọta ndị inyom. Ọ hụtara amara nʼihu mmadụ niile ndị hụrụ ya.
16 E mere ka Esta bakwuru eze nʼọnwa nke iri nʼafọ nke asaa nke ọchịchị eze Ahasuerọs.
Read Esther 2 in the app The whole chapter