The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Ecclesiastes 1
Ekpebiri m, were onwe m nye, iji amamihe nnyochapụta ihe m nwere ike ịmata banyere ihe niile a na-eme nʼime ụwa. Olee ụdị ibu arọ bụ nke a, nke Chineke bokwasịrị ụmụ mmadụ?
Ecclesiastes 1:13 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Ecclesiastes 1Next →
And I gave my heart to seek and search out by wisdom concerning all things that are done under heaven: this sore travail hath God given to the sons of man to be exercised therewith.
And I set my mind to seek and explore by wisdom all that is done under heaven. What a heavy burden God has laid upon the sons of men to occupy them!
I applied my heart to seek and to search out by wisdom concerning all that is done under the sky. It is a heavy burden that God has given to the sons of men to be afflicted with.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
10 Ọ dị ihe enwere ike ikwu sị, “Lee, ihe a bụ ihe ọhụrụ”? Ọ bụ ihe dịịrị nʼoge gara aga, nʼoge ndị garalarị tupu oge anyị.
11 Anaghị echeta ndị mgbe ochie, otu aka ahụ kwa, ọgbọ na-abịa abịa ndị ga-eso ha agakwaghị echeta ha.
12 Mụ onwe m bụ onye nkuzi, bụrịị eze Izrel nʼime Jerusalem.
13 Ekpebiri m, were onwe m nye, iji amamihe nnyochapụta ihe m nwere ike ịmata banyere ihe niile a na-eme nʼime ụwa. Olee ụdị ibu arọ bụ nke a, nke Chineke bokwasịrị ụmụ mmadụ?
14 Enyochaala m ihe niile a na-eme nʼụwa chọpụta na ha enweghị isi. Ọ dị ka mmadụ ịchụgharị ifufe.
15 Ihe gbagọrọ agbagọ, apụghị ime ya ka ọ dizie. Ihe na-ezughị ezu, enweghị ike ịgụta ha ọnụ.
16 Echere m nʼime obi m sị, “Lee anya! Aghọọla m onye ukwu, bụrụ onye maara ihe karịa ndị eze niile chịrịla na Jerusalem. Enweela m amamihe nʼebe ọ dị ukwu, babigakwa ụba oke nʼihe ọmụma.”
Read Ecclesiastes 1 in the app The whole chapter