The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Deuteronomy 9
Mgbe ahụ, eweere m ngwa ọrụ mmehie unu, ya bụ nwa ehi ahụ unu kpụrụ, kpọọ ya ọkụ, tipịa ya, gwerie ya nke ọma dịka ntụ, wụnye ntụ ya nʼime mmiri nke si nʼugwu na-asọpụta.
Deuteronomy 9:21 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Deuteronomy 9Next →
And I took your sin, the calf which ye had made, and burnt it with fire, and stamped it, and ground it very small, even until it was as small as dust: and I cast the dust thereof into the brook that descended out of the mount.
And I took that sinful thing, the calf you had made, and burned it in the fire. Then I crushed it and ground it to powder as fine as dust, and I cast it into the stream that came down from the mountain.
I took your sin, the calf which you had made, and burned it with fire, and crushed it, grinding it very small, until it was as fine as dust. I threw its dust into the brook that descended out of the mountain.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
18 Mgbe ahụ, adara m nʼala ọzọ nʼihu Onyenwe anyị. Iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, erighị m nri maọbụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ ọbụla, nʼihi mmehie niile unu mere. Unu mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị si otu a kpasuo ya iwe nke ukwuu.
19 Atụrụ m egwu iwe na ọnụma nke Onyenwe anyị, nʼihi na iwe ya dị ukwuu megide unu ruo na ikpochapụ unu. Ma nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gere ntị nʼarịrịọ m.
20 Nʼoge ahụ, Erọn nʼonwe ya, nọrọ nʼoke nsogbu, nʼihi na Onyenwe anyị were iwe megide ya, chọọ ibibi ya, ma arịọrọ m Onyenwe anyị arịrịọ nʼihi ya.
21 Mgbe ahụ, eweere m ngwa ọrụ mmehie unu, ya bụ nwa ehi ahụ unu kpụrụ, kpọọ ya ọkụ, tipịa ya, gwerie ya nke ọma dịka ntụ, wụnye ntụ ya nʼime mmiri nke si nʼugwu na-asọpụta.
22 Ọzọkwa, unu kpasuru Onyenwe anyị iwe na Tabera, na Masa, ọ bụladị na Kibrọt Hataava.
23 Mgbe Onyenwe anyị si na Kadesh Banea zipụ unu ọ sị unu, “Gaanụ nweta ala ahụ m nyere unu.” Ma unu nupuru isi nʼiwu Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu. Unu ekwenyeghị maọbụ rubere ya isi.
24 Site nʼụbọchị m maara ndị unu bụ, ọ dịbeghị mgbe unu na-enupughị isi nʼebe Onyenwe anyị nọ.
Read Deuteronomy 9 in the app The whole chapter