The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Deuteronomy 4
Onyenwe anyị wesoro m iwe nʼihi unu, ọ ṅụrụ iyi na m agaghị agafe osimiri Jọdan ịbanye nʼala ọma ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa gị.
Deuteronomy 4:21 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Deuteronomy 4Next →
Furthermore the LORD was angry with me for your sakes, and sware that I should not go over Jordan, and that I should not go in unto that good land, which the LORD thy God giveth thee for an inheritance:
The LORD, however, was angry with me on account of you, and He swore that I would not cross the Jordan to enter the good land that the LORD your God is giving you as an inheritance.
Furthermore the LORD was angry with me for your sakes, and swore that I should not go over the Jordan, and that I should not go in to that good land which the LORD your God gives you for an inheritance;
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
18 maọbụ nʼụdị anụ na-akpụ akpụ, ma ọ bụkwanụ nʼụdị azụ bi na mmiri.
19 Mgbe unu lere anya na mbara eluigwe hụ anyanwụ, ọnwa, na kpakpando, dịka ha si basaa na mbara eluigwe, unu ekwela ka unu bụrụ ndị a na-arafu ịkpọ isiala nye ha na ife ha ofufe bụ ihe ndị a Onyenwe anyị Chineke unu kere nye mba niile bi nʼokpuru eluigwe.
20 Ma banyere unu, Onyenwe anyị kpọọrọ unu, kpọpụta unu site nʼime ọkụ na-agbaze igwe, site nʼIjipt pụta, ka unu bụrụ ihe nketa ya, dịka unu dị ugbu a.
21 Onyenwe anyị wesoro m iwe nʼihi unu, ọ ṅụrụ iyi na m agaghị agafe osimiri Jọdan ịbanye nʼala ọma ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa gị.
22 Aghaghị m ịnwụ nʼala a. Agaghị m agafe Jọdan. Ma unu ga-agafe gaa nweta ala ọma ahụ.
23 Lezienụ anya ka unu ghara ichefu ọgbụgba ndụ unu na Onyenwe anyị Chineke unu nwekọrọ, unu emerela onwe unu arụsị yiri ụdịdị ihe ọbụla, ndị ahụ iwu Onyenwe anyị Chineke unu nyere megidere.
24 Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ ọkụ na-erepịa erepịa. Ọ bụ Chineke ekworo.
Read Deuteronomy 4 in the app The whole chapter