The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Deuteronomy 4
Unu atụkwasịla iwu ọzọ nʼelu iwu ndị a, ma ọ bụkwanụ site na ha wepụ iwu ọbụla. Kama, meenụ ihe iwu ndị a na-ekwu, nʼihi na ha si nʼaka Onyenwe anyị Chineke unu.
Deuteronomy 4:2 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Deuteronomy 4Next →
Ye shall not add unto the word which I command you, neither shall ye diminish ought from it, that ye may keep the commandments of the LORD your God which I command you.
You must not add to or subtract from what I command you, so that you may keep the commandments of the LORD your God that I am giving you.
You shall not add to the word which I command you, neither shall you take away from it, that you may keep the commandments of the LORD your God which I command you.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Ugbu a, O Izrel, gee ntị nʼụkpụrụ na iwu niile m na-aga ikuziri unu ka unu na-eme ma ọ bụrụ na unu chọrọ ịdị ndụ banye, ma nwetakwa ala ahụ Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha na-enye unu.
2 Unu atụkwasịla iwu ọzọ nʼelu iwu ndị a, ma ọ bụkwanụ site na ha wepụ iwu ọbụla. Kama, meenụ ihe iwu ndị a na-ekwu, nʼihi na ha si nʼaka Onyenwe anyị Chineke unu.
3 Unu ji anya unu hụ ihe Onyenwe anyị mere na Baal-Peoa. Onyenwe anyị Chineke unu sitere nʼetiti unu bibie ndị niile gbasoro Baal nke Peoa.
4 Ma unu niile nọgidesịrị ike soro Onyenwe anyị Chineke unu bụ ndị dị ndụ taa.
5 Lee, ezila m unu ụkpụrụ na iwu niile Onyenwe anyị Chineke m sị m zi unu, iwu unu na-aghaghị idebe nʼala ahụ unu na-aga inweta.
Read Deuteronomy 4 in the app The whole chapter