The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Deuteronomy 3
Ala fọdụrụ na Gilead nakwa Bashan niile na alaeze Ọg ka m nyere otu ọkara ebo Manase. Nke a bụ ala Agob niile dị na Bashan, bụ ndị amaara dịka ala ndị Refaim.
Deuteronomy 3:13 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Deuteronomy 3Next →
And the rest of Gilead, and all Bashan, being the kingdom of Og, gave I unto the half tribe of Manasseh; all the region of Argob, with all Bashan, which was called the land of giants.
To the half-tribe of Manasseh I gave the rest of Gilead and all of Bashan, the kingdom of Og. (The entire region of Argob, the whole territory of Bashan, used to be called the land of the Rephaim.)
and the rest of Gilead, and all Bashan, the kingdom of Og, I gave to the half-tribe of Manasseh—all the region of Argob, even all Bashan. (The same is called the land of Rephaim.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
10 Anyị meriri obodo ndị ahụ niile dị nʼala dị larịị, meriekwa Gilead niile na Bashan, tutu ruo obodo Saleka na Edrei, obodo ndị dị nʼalaeze Ọg, eze Bashan.
11 (Ọg, eze ndị Bashan bụ naanị onye fọdụrụ ndụ nʼagbụrụ ndị Refaim. E ji igwe kwaa ihe ndina ya, nke ogologo ya dị mita anọ, nke obosara ya bụkwa mita abụọ. Ihe ndina a dị ruo taa nʼobodo Raba, otu nʼime obodo ndị Amọn.)
12 Mgbe anyị nwetara ala ndị a, eweere m ya nye ndị Ruben, na Gad, ya bụ, oke ala dị nʼebe obodo ugwu Aroea, nke dị nʼakụkụ ndagwurugwu Anọn. Tinyekwara ọkara obodo ugwu Gilead, na obodo niile dị nʼime ya.
13 Ala fọdụrụ na Gilead nakwa Bashan niile na alaeze Ọg ka m nyere otu ọkara ebo Manase. Nke a bụ ala Agob niile dị na Bashan, bụ ndị amaara dịka ala ndị Refaim.
14 Jaịa, onye si nʼebo Manase, were ala niile dị nʼAgob, ọ bụladị ruo nʼoke ala ndị Geshua na ndị Maaka. Ọ kpọrọ ya nʼaha ya, nke mere na ruo taa ihe a na-akpọ Bashan bụ Havọt Jaịa, nke pụtara, obodo Jaịa.
15 Makia ka m nyere Gilead.
16 Ma Ebo Ruben na Gad ka m nyere ala niile dị site na Gilead ruo nʼetiti ndagwurugwu Anọn, na site na ndagwurugwu a ruo nʼiyi Jabọk, nke bụ oke ala ụmụ Amọn. Etiti ndagwurugwu Anọn bụkwa oke ala ebo Ruben na Gad.
Read Deuteronomy 3 in the app The whole chapter