The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Deuteronomy 28
Onyenwe anyị ga-ezite ajọ ọrịa nʼetiti gị tutu ruo mgbe a ga-ekpochapụ gị site nʼala ahụ ị gaje ịba nʼime ya inweta.
Deuteronomy 28:21 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Deuteronomy 28Next →
The LORD shall make the pestilence cleave unto thee, until he have consumed thee from off the land, whither thou goest to possess it.
The LORD will make the plague cling to you until He has exterminated you from the land that you are entering to possess.
The LORD will make the pestilence cling to you, until he has consumed you from off the land where you go in to possess it.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
18 Ihe a bụrụ ọnụ ka mkpụrụ nke afọ gị ga-abụ, ihe a bụrụ ọnụ ka mkpụrụ nke ala gị ga-abụ, ya na ụmụ nke igwe anụ ụlọ gị, na ụmụ ehi gị na nke igwe ewu na atụrụ gị mụrụ.
19 Onye a bụrụ ọnụ ka ị ga-abụ mgbe ị na-abata abata na mgbe ị na-apụ apụ.
20 Onyenwe anyị ga-ezidata nʼisi gị ọbụbụ ọnụ, na ọgbaaghara, tinyere nkọcha nʼihe niile nke i tinyere aka gị, tutu ruo mgbe ị ghọrọ onye e bibiri ebibi bụrụ onye lara nʼiyi na mberede, nʼihi ihe ọjọọ niile i mere site nʼịhapụ m.
21 Onyenwe anyị ga-ezite ajọ ọrịa nʼetiti gị tutu ruo mgbe a ga-ekpochapụ gị site nʼala ahụ ị gaje ịba nʼime ya inweta.
22 Onyenwe anyị ga-eti unu ọrịa na-eripịa eripịa, ahụ ọkụ na ọrịa na-aza anụ ahụ, oke okpomọkụ na mma agha, ụkọ mmiri ozuzo na ọrịa na-eripịa ihe ubi, na ọmụma ebu ga-abịakwasị gị tutu ruo mgbe i lara nʼiyi.
23 Mbara eluigwe nke ị na-ahụ anya ga-aghọ bronz, ala ị na-azọkwasị ụkwụ gị ga-aghọ igwe.
24 Onyenwe anyị ga-eme ka mmiri kwesiri izo nʼala gị ghọọ uzuzu na aja. Ha ga-esi na mbara eluigwe na-ezodata nʼala tutu ruo mgbe ị lara nʼiyi.
Read Deuteronomy 28 in the app The whole chapter