The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Deuteronomy 21

Deuteronomy 21:12

Ị ga-akpọbata ya nʼụlọ gị, mee ka ọ kpụcha agịrị isi ya, bekwaa mbọ ya niile,

Deuteronomy 21:12 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Deuteronomy 21Next →

Deuteronomy 21:12 in other translations

KJV King James Version

Then thou shalt bring her home to thine house; and she shall shave her head, and pare her nails;

BSB Berean Standard Bible

then you shall bring her into your house. She must shave her head, trim her nails,

WEB World English Bible

then you shall bring her home to your house. She shall shave her head and trim her nails.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

9 Nʼụzọ dị otu a, ka ị ga-esi wezugara onwe gị ikpe ọmụma gaara abụ nke gị nʼihi ọbara onye ahụ nwụrụ anwụ, ebe ọ bụ na i meela ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị.

10 Mgbe ị pụrụ ibuso ndị iro gị agha, ọ bụrụ na Onyenwe anyị Chineke gị emee ka i merie ndị iro gị, dọta ụfọdụ nʼime ha nʼagha,

11 ọ bụrụ na ị hụ nwaagbọghọ mara mma nke masịrị gị nʼetiti ndị a dọtara nʼagha, i nwere ike iduru ya ka ọ bụrụ nwunye gị.

12 Ị ga-akpọbata ya nʼụlọ gị, mee ka ọ kpụcha agịrị isi ya, bekwaa mbọ ya niile,

13 yipụ uwe ahụ o yi mgbe e jidere ya. Ọ ga-anọdụ nʼụlọ gị ruo ụjụ nʼihi nna ya na nne ya otu ọnwa. Emesịa, i nwere ike ịbakwuru ya ghọọ di ya, ya onwe ya ga-aghọkwa nwunye gị.

14 Ọ bụrụ na ihe ya amasịkwaghị gị, ị ga-ahapụ ya ka ọ gaa ebe ọbụla ọ chọrọ. Ị gaghị ere ya nʼọnụ ego ọbụla maọbụ kpasi ya agwa dịka ohu, ebe ọ bụ na ị wedala ya nʼala site nʼịhụ ọtọ ya anya.

15 Ọ bụrụ na nwoke lụrụ ndị inyom abụọ, ma hụ otu nʼime ha nʼanya karịa nke ọzọ, ọ bụrụkwa na ndị inyom abụọ ahụ mụtaara ya ụmụ ndị ikom, ma nwanyị ahụ ọ kpọrọ asị buuru ụzọ mụta nwa nwoke,

Read Deuteronomy 21 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV