The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Deuteronomy 16

Deuteronomy 16:13

Mmenụ mmemme ụlọ Ikwu. Unu aghaghị ime ya ụbọchị asaa mgbe unu wechara ihe ubi, ya bụ, mgbe unu chịkọtachara ọka site nʼebe ịzọcha ọka, nakwa ebe ịzọcha mmanya unu niile

Deuteronomy 16:13 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Deuteronomy 16Next →

Deuteronomy 16:13 in other translations

KJV King James Version

Thou shalt observe the feast of tabernacles seven days, after that thou hast gathered in thy corn and thy wine:

BSB Berean Standard Bible

You are to celebrate the Feast of Tabernacles for seven days after you have gathered the produce of your threshing floor and your winepress.

WEB World English Bible

You shall keep the feast of booths seven days, after you have gathered in from your threshing floor and from your wine press.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

10 Meenụ Mmemme Izu Ụka asaa nye Onyenwe anyị, bụ Chineke gị, site na inye onyinye afọ ofufu, nʼusoro ọtụtụ ngọzị Onyenwe anyị bụ Chineke gị ji gọzie gị.

11 Ọ bụ oge ịṅụrị ọṅụ nye gị na ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom, ndị ohu gị nwoke na nwanyị, ndị Livayị bi nʼobodo gị, ndị ọbịa, ndị na-enweghị nna na ndị inyom di ha nwụrụ bi nʼetiti gị. Meenụ nke a nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị, nʼebe ahụ ọ họpụtara dịka ebe obibi nye aha ya.

12 Cheta na ị bụrị ohu nʼala Ijipt, nʼihi nke a, unu echefula iwu ndị a.

13 Mmenụ mmemme ụlọ Ikwu. Unu aghaghị ime ya ụbọchị asaa mgbe unu wechara ihe ubi, ya bụ, mgbe unu chịkọtachara ọka site nʼebe ịzọcha ọka, nakwa ebe ịzọcha mmanya unu niile

14 Ọ bụ oge ịṅụrị ọṅụ, nye gị onwe gị, ụmụ ndị ikom na ndị inyom gị, ndị odibo nwoke na nwanyị unu niile, ndị Livayị, ndị ọbịa, ụmụ mgbei na ụmụ nwanyị niile di ha nwụrụ anwụ ndị bi nʼobodo gị niile.

15 A ga-eme mmemme a nye Onyenwe anyị Chineke gị ụbọchị asaa nʼebe ahụ Onyenwe anyị nʼonwe ya họpụtara. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi ihe ubi gị niile, gọziekwa akaọrụ gị niile, ime ka ọṅụ gị zuo oke.

16 Ugboro atọ nʼafọ ka ndị ikom unu niile aghaghị ịbịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị unu, nʼebe ọ ga-ahọpụta: nʼoge mmemme ndị a: Mmemme Achịcha na-ekoghị eko, Mmemme Izu Ụka asaa na Mmemme Ụlọ Ikwu. Ọ dịghị onye ọbụla ga-agba aka efu bịa nʼihu Onyenwe anyị.

Read Deuteronomy 16 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV