The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Deuteronomy 14

Deuteronomy 14:21

Unu erila anụ ọbụla nwụrụ anwụ. Ma otu o si dị, onye ọbịa nʼetiti unu nwere ike rie ya. I nwere ike inye ya, maọbụ resi ya onye ahụ, ma erila ya, nʼihi na onye dị nsọ nye Onyenwe anyị Chineke gị ka ị bụ. Esila nwa ewu maọbụ nwa atụrụ nʼime mmiri ara nne ya.

Deuteronomy 14:21 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Deuteronomy 14Next →

Deuteronomy 14:21 in other translations

KJV King James Version

Ye shall not eat of any thing that dieth of itself: thou shalt give it unto the stranger that is in thy gates, that he may eat it; or thou mayest sell it unto an alien: for thou art an holy people unto the LORD thy God. Thou shalt not seethe a kid in his mother's milk.

BSB Berean Standard Bible

You are not to eat any carcass; you may give it to the foreigner residing within your gates, and he may eat it, or you may sell it to a foreigner. For you are a holy people belonging to the LORD your God. You must not cook a young goat in its mother’s milk.

WEB World English Bible

You shall not eat of anything that dies of itself. You may give it to the foreigner living among you who is within your gates, that he may eat it; or you may sell it to a foreigner; for you are a holy people to the LORD your God. You shall not boil a young goat in its mother’s milk.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

18 na ụgbala, na utù dị iche iche, na nnụnụ ọdụ nta, na ụsụ.

19 Ụmụ ahụhụ niile na-efe efe rụrụ arụ nye unu, unu erila ha,

20 Ma unu nwere ike iri ụmụ ahụhụ ndị ahụ nwere nku, ndị dị ọcha.

21 Unu erila anụ ọbụla nwụrụ anwụ. Ma otu o si dị, onye ọbịa nʼetiti unu nwere ike rie ya. I nwere ike inye ya, maọbụ resi ya onye ahụ, ma erila ya, nʼihi na onye dị nsọ nye Onyenwe anyị Chineke gị ka ị bụ. Esila nwa ewu maọbụ nwa atụrụ nʼime mmiri ara nne ya.

22 Ị ghaghị inye otu ụzọ nʼụzọ iri nke mkpụrụ ubi gị afọ niile.

23 Ị ga-erikwa mkpụrụ ndị a nʼihu Onyenwe anyị, bụ Chineke gị, nʼebe ahụ ọ ga-ahọpụta ka ọ bụrụ ebe obibi ya, ị ga-anọ nʼebe ahụ rie otu ụzọ nʼụzọ iri nke ọka gị, na mmanya vaịnị ọhụrụ gị, na mmanụ oliv gị, na nwa mbụ nke igwe ehi gị, na igwe ewu na atụrụ gị. Ihe e ji eme nke a bụ ka ị mụta ịtụ egwu Onyenwe anyị Chineke gị ụbọchị ndụ gị niile.

24 Ọ bụrụ na ebe Onyenwe anyị họpụtara dị anya, ọ bụrụkwa na Onyenwe anyị Chineke gị agọziela gị ruo na ị pụghị ibu otu ụzọ nʼụzọ iri gị gaa nʼebe ahụ (nʼihi na ebe ahụ Onyenwe anyị họpụtara dị anya),

Read Deuteronomy 14 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV