The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Daniel 8

Daniel 8:20

Ma banyere ebule ahụ ị hụrụ nke nwere mpi abụọ, na-egosi eze Midia na Peshịa.

Daniel 8:20 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Daniel 8Next →

Daniel 8:20 in other translations

KJV King James Version

The ram which thou sawest having two horns are the kings of Media and Persia.

BSB Berean Standard Bible

The two-horned ram that you saw represents the kings of Media and Persia.

WEB World English Bible

The ram which you saw, that had the two horns, they are the kings of Media and Persia.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

17 Mgbe ọ bịara m nso nʼebe m guzo, egwu tụrụ m nke ukwu. Adara m, kpuo ihu m nʼala. Ma ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, ghọta na ọhụ a bụ maka ọgwụgwụ oge.”

18 Mgbe ahụ ọ na-agwa m okwu, adara m nʼoke ụra, kpuo ihu nʼala. Ma o metụrụ m aka, nyere m aka iguzo ọtọ nʼụkwụ m.

19 Ọ sịrị, “Lee, aga m agwa gị ihe na-aga ime nʼoge oke iwe. Nʼihi na ọhụ a bụ maka oge ọgwụgwụ ihe niile nke a kara aka.

20 Ma banyere ebule ahụ ị hụrụ nke nwere mpi abụọ, na-egosi eze Midia na Peshịa.

21 Mkpi ahụ ị hụrụ na-egosi eze ndị Griis, nnukwu mpi nke dị nʼetiti anya ya abụọ bụ eze nke mbụ.

22 Dịka mpi ahụ siri gbajie, mpi anọ ọzọ pupụta nʼọnọdụ ya, otu a ka alaeze anọ ga-esi pụta na mba ya, ma ike ha agaghị eru ka nke mbụ ahụ.

23 “Ma na mgbe ọgwụgwụ alaeze ahụ, mgbe iko ndị nnupu isi juru, otu eze nke nwere ihu dị ike, na akọnuche na obi aghụghọ ga-ebili.

Read Daniel 8 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV