The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Daniel 8
Ọ gwara m, “A ga-echere tutu puku ụbọchị abụọ na narị ụbọchị atọ agafee, mgbe ahụ a ga-eme ka ebe nsọ ahụ dịghachikwa otu ọ dị na mbụ.”
Daniel 8:14 · Baịbụlụ Nsọ
And he said unto me, Unto two thousand and three hundred days; then shall the sanctuary be cleansed.
He said to me, “It will take 2,300 evenings and mornings; then the sanctuary will be properly restored.”
He said to me, “To two thousand and three hundred evenings and mornings. Then the sanctuary will be cleansed.”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
11 O mere onwe ya ka ọ dị ukwuu megide onyeisi nke usuu eluigwe, ọ napụrụ ya aja niile a na-achụ kwa ụbọchị ma tụdakwa ebe nsọ ya nʼala.
12 Nʼihi nnupu isi, e nyefere usuu ndị nsọ na aja nsure ọkụ a na-esure kwa ụbọchị nʼaka ya. Ọ gara nʼihu nʼihe niile o mere. E mekwara ka eziokwu daa nʼala.
13 Mgbe ahụ, anụrụ m ka otu mmụọ ozi na-ajụ ibe ya sị, “Olee mgbe ọ ga-akwụsị bụ ọhụ maka aja nsure ọkụ a na-achụ kwa ụbọchị, njehie nke na-eweta ịtọgbọ nʼefu, inyefe ebe nsọ na maka ndị nsọ a na-azọtọ ụkwụ?”
14 Ọ gwara m, “A ga-echere tutu puku ụbọchị abụọ na narị ụbọchị atọ agafee, mgbe ahụ a ga-eme ka ebe nsọ ahụ dịghachikwa otu ọ dị na mbụ.”
15 Mgbe mụ bụ Daniel nọ na-ele ọhụ ahụ na-achọkwa ịghọta ya, o nwere otu onye dịka nwoke bịara guzo nʼihu m.
16 Ma anụrụ m olu otu onye na-akpọ oku site na mmiri Ulai sị, “Gebrel, kọwaara nwoke a ihe ọhụ a pụtara.”
17 Mgbe ọ bịara m nso nʼebe m guzo, egwu tụrụ m nke ukwu. Adara m, kpuo ihu m nʼala. Ma ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, ghọta na ọhụ a bụ maka ọgwụgwụ oge.”
Read Daniel 8 in the app The whole chapter