The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Daniel 4
Lee ka ihe ịrịbama ya, na ihe ịtụnanya ya si dị ukwuu! Alaeze ya bụ nke na-adị site ebighị ebi ruo ebighị ebi; ọchịchị ya na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Daniel 4:3 · Baịbụlụ Nsọ
How great are his signs! and how mighty are his wonders! his kingdom is an everlasting kingdom, and his dominion is from generation to generation.
How great are His signs, how mighty His wonders! His kingdom is an eternal kingdom; His dominion endures from generation to generation.
How great are his signs! How mighty are his wonders! His kingdom is an everlasting kingdom. His dominion is from generation to generation.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Mụ bụ Nebukadneza, Na e zigara mmadụ niile, mba niile, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche nʼụwa ozi: Ka ọ dịrị unu na mma!
2 E ji m obi ụtọ, na-eme ka unu mata ihe ịrịbama niile na ihe iju anya niile, nke Chineke Onye kachasị ihe niile elu meere m.
3 Lee ka ihe ịrịbama ya, na ihe ịtụnanya ya si dị ukwuu! Alaeze ya bụ nke na-adị site ebighị ebi ruo ebighị ebi; ọchịchị ya na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
4 Mụ onwe m, bụ Nebukadneza nọ nʼafọ ojuju na ihe ịga nke ọma nʼụlọeze m.
5 Arọrọ m nrọ, nke mere ka ụjọ tụọ m. Ihe niile m hụrụ na nrọ mgbe m dina ala nʼelu akwa mere ka oke ụjọ tụọ m.
6 Nʼihi ya, enyere m iwu ka a kpọọ ndị amamihe niile m nwere na Babilọn ka ha bịa nʼihu m, bịa kọwaara m isi nrọ ahụ.
Read Daniel 4 in the app The whole chapter