The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Daniel 4
“Eze, nke a bụ nkọwa nrọ ị rọrọ, Onye kachasị ihe niile elu enyela iwu nke na-aghaghị imezu megide onyenwe m eze.
Daniel 4:24 · Baịbụlụ Nsọ
This is the interpretation, O king, and this is the decree of the most High, which is come upon my lord the king:
This is the interpretation, O king, and this is the decree that the Most High has issued against my lord the king:
“This is the interpretation, O king, and it is the decree of the Most High, which has come on my lord the king:
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
21 nke nwekwara akwụkwọ ndụ dị mma, na nke jupụtara na mkpụrụ, nke na-egboro mmadụ niile mkpa nri, nke ụmụ anụmanụ ọhịa niile na-ebi nʼokpuru ndo ya, nke ụmụ nnụnụ niile nke eluigwe nwere akwụ ebe obibi ha,
22 osisi ahụ bụ gị onwe gị, eze. Nʼihi na i toola bụrụ onye dị ike na onye dị ukwuu. Ịdị ukwu gị eruola nʼeluigwe. Ọchịchị gị eruokwala nʼakụkụ niile nke ụwa.
23 “Mgbe ahụ, ị hụkwara onye dị nsọ na-enyocha omume ndị mmadụ nke si nʼeluigwe rịdata na-asị, ‘Gbutuonụ osisi a, laa ya nʼiyi, ma unu hapụ ogwe ya ka ahịhịa ndụ gbaa ya gburugburu, ka e jirikwa ụdọ igwe na bronz kee ya gburugburu; hapụ ya ka igirigi nke eluigwe zokwasị ya. Hapụkwa ya ka o soro anụ ọhịa taa ahịhịa dịka nri ya tutu afọ asaa a gafee.’
24 “Eze, nke a bụ nkọwa nrọ ị rọrọ, Onye kachasị ihe niile elu enyela iwu nke na-aghaghị imezu megide onyenwe m eze.
25 A ga-achụpụ gị site nʼebe ndị mmadụ nọ. A ga-achụgakwa gị nʼebe gị na ụmụ anụmanụ ga-ebi nʼọhịa, Ebe ahụ ka ị ga-anọ taa ahịhịa dịka oke ehi, igirigi nke eluigwe ga-ezokwasịkwa gị. Ọnụọgụgụ afọ asaa ga-agabiga tutu ruo mgbe ị nabatara na Onye kachasị ihe niile elu na-achị achị nʼalaeze niile nke mmadụ, na ọ bụkwa nʼaka onye ọbụla ọ chọrọ ka ọ na-enyefe ha.
26 Dịka e siri nye nʼiwu ka a hapụ ogwe osisi ahụ na mgbọrọgwụ ya nʼime ala. Nke a na-egosi na ị ga-emecha nwetaghachi alaeze gị mgbe ị nabatara na Eluigwe na-achị achị.
27 Ya mere, biko eze, kweere nabata ndụmọdụ m, kwụsị ime mmehie, mee ihe ziri ezi, werekwa omume ileta ndị ogbenye dochie nʼọnọdụ ajọ omume gị. Eleghị anya, ihe ga na-agara gị nke ọma.”
Read Daniel 4 in the app The whole chapter